Zefanaya 1:1 Okwu Jehova nke ruru Zefanaya nwa Kushi, nwa nke Gedalaia, nwa Amaraia, nwa Hizkaia, n'ubọchi nke Chineke Josaia nwa Amon, bú eze Juda. 1:2 M'gēkpochapusi ihe nile n'ala nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 1:3 M'gēripia madu na anumanu; M'gēripia anu-ufe nke elu-igwe; na azù nke oké osimiri, na ihe-isu-ngọngọ ha na ndi nēmebi iwu: na M'gēbipu madu n'ala nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 1:4 M'gēseti kwa akam n'aru Juda, na n'aru ndi nile ndị bi na Jeruselem; M'gēbipu kwa n'aru Beal fọduru ebe a, na aha ndị Kemarim na ndị nchụàjà; 1:5 na ndi nākpọ isi ala nye usu-ndi-agha nke elu-igwe n'elu ulo; na ha ndi nākpọ isi ala na ndi nēwere Jehova ṅu iyi, na ndi nēji Malkam ṅu iyi; 1:6 na ndị si n'ebe Jehova nọ laghachi; na ndị na-enweghị chọsie Jehova ike, ọ chọghi kwa Ya ajuju. 1:7 Dere du n'iru Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ubọchi Jehova ọ di nso: n'ihi na Jehova edoziwo àjà, O we gosi nke ya ọbịa. 1:8 Ọ gēru kwa, n'ubọchi àjà Jehova, na M M'gēji kwa leta ndi-isi, na umu-ndikom eze, leta kwa ndi nile di otú a yi uwe iju . NDI-EZE 1:9 N'otù ubọchi ahu ka M'gēji leta ndi nile nāmali nbata-uzọ; ndi nēmeju ulo ndi-nwe-ha n'ihe-ike na aghughọ. 1:10 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ọ gādi burunu olu iti-nkpu nke si n'ọnu-uzọ-ama azù, na iti-nkpu nke si n'ọnu-uzọ-ama azù nke-abua, na oké ntipia sitere n'ugwu. 1:11 Kwasienu ákwá ike, unu ndi bi na Maktesh, n'ihi na ebipuwo ndi-ahia nile gbadaa; Ebipuwo ndi nile nēbu ọla-ọcha. 1:12 Ọ gēru kwa, na mb͕e ahu, na M'gāchọ Jerusalem were kandụl, leta ndikom ahu ndi nānọdu n'elu ulo-ha: nke ahu si n'obi-ha, Jehova agaghi-eme ezi ihe, Ọ gēme kwa ihe ọjọ. 1:13 Ya mere ngwongwo ha ga-aghọ ihe nkwata, na ụlọ ha a ebe tọb͕ọrọ n'efu: ha gēwu kwa ulo, ma ha agaghi-ebi nime ha; na ha gāku ubi-vine, ma ọ gaghi-aṅu manya-vine-ya. 1:14 Oké ubọchi Jehova di nso, ọ di nso, ọ nēme kwa ngwa nke-uku, ọbuná olu nke ubọchi Jehova: dike gātiku n'ebe ahu nke ilu. 1:15 Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ọnụma, ụbọchị nsogbu na mkpagbu, ụbọchị nke tọb͕ọrọ n'efu na itọb͕ọrọ n'efu, ubọchi ọchichiri na ọchichiri, bú ubọchi nke ọchichiri ígwé ojii na oké ọchịchịrị, 1:16 A ụbọchị nke opi na opi megide obodo ewusiri ike, na megide ụlọ elu ndị dị elu. 1:17 M'gēme kwa ka nkpab͕u biakwasi madu, ka ha we je ije dika ndi-ìsì; n'ihi na ha emehiewo megide Jehova: ọbara-ha gādi kwa ọ bu kwa uzuzu ka anāwusi anu-aru-ha dika ǹsí. 1:18 Ma ọlaọcha ha ma ọ bụ ọla edo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha n’ime i ụbọchị iwe Jehova; ma ala ahu nile ka Jehova gēripia ọku nke ekworo-Ya: n'ihi na ọbuná ihe nile ka Ọ gēme ngwa ngwa ndi bi n'ala.