Abụ Ọma
ABÙ ỌMA 147:1 Kelenu Jehova: n'ihi na ọ di nma ibu abù ọma nye Chineke-ayi; maka ya
dị ụtọ; otuto di kwa nma.
147:2 Jehova ewuliwo Jerusalem: Ọ nāchikọta ndi achupuru achupu
Israel.
147:3 Ọ nāgwọ ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nēkechi kwa ọnyá-ha nile.
147:4 Ọ nāgu ọnu-ọgugu kpakpando; Ọ nākpọ ha nile n'aha-ha.
147:5 Onye uku ka Onye-nwe-ayi di, Ọ bu kwa ike uku: Nghọta-Ya adighi-ọgwugwu.
147:6 Jehova nēbuli ndi di ume-ala n'obi: Ọ nātuda ndi nēmebi iwu n'ala.
147:7 Werenu ekele bùkue Jehova abù; Bùkuenu ayi abù ọma n'ubọ-akwara
Chineke:
147:8 Onye nēkpuchi elu-igwe n'igwe-oji, Onye nēdozi miri-ozuzo nye uwa;
Onye nēme ka ahihia pue n'elu ugwu.
147:9 Ọ nēnye anu-ọhia ihe-oriri-ya, Nye kwa umu ugolo-ọma nēti nkpu.
147:10 Ọ dighi-atọ ya utọ n'ike inyinya;
n'ụkwụ nwoke.
147:11 Jehova nātọ ndi nātu egwu Ya utọ, bú ndi nēle anya
ebere ya.
147:12 Kelenu Jehova, Jerusalem; Tonu Chineke-gi, Zaion.
147:13 N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi di ike; Ọ gọziwo gi
ụmụaka nọ n'ime gị.
147:14 Ọ nēme ka udo di n'ókè-ala-gi nile, Ọ nēmeju kwa gi n'ihe kachasi nma nke Jehova
ọka wit.
147:15 Ọ nēzipu okwu-Ya n'uwa: Okwu-Ya nāb͕a ọsọ nke-uku
ngwa ngwa.
ABÙ ỌMA 147:16 Ọ nēnye snow dika aji-anu: Ọ nēfesa oké ifufe dika ntu.
147:17 Ọ nāwupu ice-ya dika nri-ututu: ònye gēguzo n'iru oyi-ya?
147:18 Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha: Ọ nēme ka ifufe-Ya fefu;
na mmiri na-asọpụta.
ABÙ ỌMA 147:19 Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya, Ọ nēgosi kwa ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile
Israel.
147:20 O mesoghi mba ọ bula otú a: Ma ikpé-Ya nile, ha
amabeghị ha. Toonu Jehova.