Abụ Ọma
142:1 M'were olum kpọkue Jehova; Olum ka m'were me Jehova
rịọ m arịrịọ.
142:2 M'gāwukwasi mkpesam n'iru Ya; M'we gosi n'iru Ya nkpab͕um.
ABÙ ỌMA 142:3 Mb͕e mọm siri ike n'arum, I we mara uzọm. N'ime
uzọ nke m'jere nime ya ka ha tọrọ ọnyà nyem.
142:4 M'we lekwasi n'aka-nrim anya, ma ọ dighi onye nāchọ
maram: ebe-nb͕abà adawom; ọ dịghị onye chekọtara mkpụrụ obi m.
ABÙ ỌMA 142:5 M'kpọkuru Gi, Jehova: M'siri, Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm na òkèm nime ya.
ala ndi di ndu.
142:6 Ṅaa ntị n'etiku m; n'ihi na emewom ka m'we di ala nke-uku: naputam n'akam
ndị na-akpagbu; n'ihi na ha di ike karim.
142:7 Weputa nkpuru-obim n'ulo-nkpọrọ, Ka m'we too aha-Gi: onye ezi omume
gāb͕am buruburu; n'ihi na i gēmesom nke-uku.