Abụ Ọma
136:1 Unu kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: n'ihi na ebere-Ya nādiru
mgbe.
136:2 Kelenu Chineke nke chi nile: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:3 Kelenu Onye-nwe nke ndi-nwenu: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
ABÙ ỌMA 136:4 Ọ bu nání Ya nālu ọlu-ebube di uku: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:5 Nye onye ji amamihe me elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:6 Nye Onye setiworo uwa n'elu miri: N'ihi ebere-Ya
nādigide rue mb͕e ebighi-ebi.
136:7 N'ihi na Onye mere oké ìhè: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:8 Anyanwu ichi n'ehihie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:9 Ọnwa na kpakpando ka ha chịa n'abali: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
ABÙ ỌMA 136:10 Ọ diri onye nētib͕u Ijipt n'ọkpara-ya: N'ihi na ebere-Ya nādiru
mgbe:
136:11 O we me ka Israel si n'etiti ha puta: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:12 N'aka di ike, were kwa ogwe-aka esetiri eseti: N'ihi na ebere-Ya di
ruo mgbe ebighị ebi.
136:13 Nye Onye kere Oké Osimiri Uhie n'akụkụ nile: N'ihi na ebere-Ya di
mgbe:
136:14 O we me ka Israel gabiga n'etiti ya: N'ihi na ebere-Ya di
ruo mgbe ebighị ebi:
136:15 Ma ọ kwaturu Fero na usu-ndi-agha-ya n'Oké Osimiri Uhie: n'ihi ebere-Ya
nādigide rue mb͕e ebighi-ebi.
136:16 Nye onye dugara ndi-Ya n'ọzara: n'ihi ebere-Ya
nādigide rue mb͕e ebighi-ebi.
136:17 Nye onye nētib͕u ndi-eze uku: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:18 O b͕u-kwa-ra ndi-eze amara amara: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:19 Saihon, bú eze ndi-Amorait: n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:20 na Og, bú eze Beshan: n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:21 O we nye ala-ha ka ọ buru ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:22 Ọbuná ihe-nketa enyere Israel orù-Ya: N'ihi na ebere-Ya di
mgbe.
136:23 Onye chetara ayi n'ọnọdu di ala-ayi: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:24 Ọ we naputa ayi n'aka ndi-iro-ayi: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:25 Onye nēnye anu-aru nile ihe-oriri: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
136:26 Kelenu Chineke nke elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.