Abụ Ọma
132:1 Jehova, cheta Devid, na mkpagbu-ya nile.
ABÙ ỌMA 132:2 Otú Ọ ṅuru Jehova iyi, O we ṅuru Elohim di ike nke Jekob nkwa;
132:3 N'ezie m'gaghi-abà n'ulo-ikwū nke ulom, M'gaghi-abà kwa
akwa m;
ABÙ ỌMA 132:4 M'gaghi-enye anyam ura, M'gaghi-eme kwa ka iru-ura nye nku anyam;
132:5 Rue mb͕e M'gāchọtara Jehova ọnọdu, Ebe-obibi nke Chineke di uku
nke Jekob.
132:6 Le, ayi nuru ya n'Efrata: Ayi chọtara ya n'ọhia nke oké ọhia.
132:7 Ayi gābà n'ulo-ikwū-Ya: Ayi gākpọ isi ala n'ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya.
132:8 Bilie, Jehova, ba n'izu-ike-Gi; Gi onwe-gi, na ib͕e ike-Gi.
132:9 Ka ndi-nchu-àjà gi yikwasi ezi omume; Ka ndi-nsọ-Gi ti kwa nkpu
maka ọṅụ.
ABÙ ỌMA 132:10 N'ihi orù-Gi, bú Devid, emela ka iru onye-Gi etere manu laghachi azu.
ABÙ ỌMA 132:11 Jehova ṅuara Devid iyi n'ezi-okwu; ọ gaghi-esi na ya chigharia; Nke
M'gātukwasi nkpuru nke afọ-gi n'oche-eze-gi.
132:12 Ọ bụrụ na ụmụ gị ga-edebe ọgbụgba ndụ m na ihe àmà m nke m ga-
zí ha, umu-ha gānọkwasi kwa n'oche-eze-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.
132:13 N'ihi na Jehova arọputawo Zaion; Ọ chọsiwo ya ike ka ọ buru ebe-obibi-Ya.
132:14 Nka bu izu-ikem rue mb͕e ebighi-ebi: n'ebe a ka m'gēbi; n'ihi na achọsiwom ya.
132:15 M'gāgọzi kwa ihe-oriri-ya nke-uku: M'gēji meju ob͕eye-ya afọ
achịcha.
132:16 M'gēyikwasi kwa ndi-nchu-àjà-ya nzọputa: Ndi-nsọ-ya gādi kwa
tie mkpu ọṅụ.
ABÙ ỌMA 132:17 N'ebe ahu ka M'gēme ka mpi Devid pua: edowom oriọna nye ya.
nke m tere mmanụ.
132:18 Ndi-iro-ya ka M'gēyikwasi ihere: Ma n'isi-ya ka okpu-eze-ya ka M'gēyikwasi
ito eto.