Abụ Ọma
131:1 Jehova, obim adigh-elu-elu, anyam adigh kwa elu: Mu onwem adigh
na-eme onwe m ihe n'oké ihe, ma ọ bụ n'ihe ndị dị elu karịa m.
ABÙ ỌMA 131:2 N'ezie emewom omume, me kwa kam daa, dika nwata nke emere ka ọ rapu ara;
nne-ya: nkpuru-obim di kwa ka nwa arapuru ara.
131:3 Ka Israel nwee olileanya na Jehova site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.