Abụ Ọma
ABÙ ỌMA 130:1 Site n'ebe di omimi ka m'kpọkuworo Gi, Jehova.
130:2 Jehova, nuru olum: Ka nti-Gi ṅa nti n'olu nkem
aririọ.
ABÙ ỌMA 130:3 Jehova, Ọ buru na Gi onwe-gi ama ajọ omume, Jehova, ònye gēguzo?
130:4 Ma enwere mgbaghara n'aka gị, ka ewe tụọ egwu gị.
130:5 Mu onwem nēchere Jehova, nkpuru-obim nēchere, Ọ bu kwa okwu-Ya ka m'chereworo.
ABÙ ỌMA 130:6 Nkpuru-obim nēchere Jehova kari ndi nēche ututu;
Asim, kari ndi nēche ututu.
130:7 Ka Israel nwee olileanya na Jehova: n'ihi na n'ebe Jehova nọ ka ebere di
Ọ bu ihe-nb͕aputa bara uba.
130:8 Ọ gāb͕aputa kwa Israel n'ajọ omume-ya nile.