Abụ Ọma
125:1 Ndi nātukwasi Jehova obi gādi ka ugwu Zaion, nke nāpughi idi
ewepụrụ, ma ọ ga-adịru mgbe ebighị ebi.
ABÙ ỌMA 125:2 Dika ugwu nile si di Jerusalem buruburu, otú a ka Jehova di buruburu
ndi-Ya site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.
125:3 N'ihi na nkpa-n'aka nke ndi nēmebi iwu agaghi-adakwasi n'ife-nzà nke ndi ezi omume;
Ka ndi ezi omume we ghara isetipu aka-ha ime ajọ omume.
ABÙ ỌMA 125:4 Jehova, me ndi di nma, me kwa ndi ziri ezi, di nma
n’ime obi ha.
125:5 Ma ndi nēwezuga onwe-ha n'uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ, Jehova gēdu
ha na ndi nālu ajọ ihe puta: ma udo gādikwasi Israel.