Abụ Ọma
ABÙ ỌMA 121:1 M'gēweli kwa anyam abua le ugwu ntà, òle ebe iye-akam si bia.
121:2 Iyerem nēsi n'aka Jehova bia, Onye mere elu-igwe na uwa.
121:3 Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga ukwu-gi n'ọnọdu-ya: Onye nēdebe gi agaghi-ekwe
ura.
121:4 Le, onye nēdebe Israel agaghi-araru ura, ọ dighi kwa ura.
ABÙ ỌMA 121:5 Jehova bu onye nēdebe gi: Jehova bu ndò-gi n'aka-nri-gi.
121:6 Anyanwu agaghi-eti gi n'ehihie, ọnwa agaghi-eti kwa gi n'abali.
ABÙ ỌMA 121:7 Jehova gēchebe gi ka i pua n'ihe ọjọ ọ bula: Ọ gēdebe kwa nkpuru-obi-gi.
121:8 Jehova gēchezi ọpupu-gi na nbata-gi site na mb͕e a
pụta, na ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.