Abụ Ọma
ABÙ ỌMA 120:1 N'ahuhum ka m'tikuworo Jehova, Ọ we zam.
ABÙ ỌMA 120:2 Jehova, naputa nkpuru-obim n'eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha, na n'ire aghughọ.
120:3 Gịnị ka a ga-enye gị? ma-ọbu gini ka agēme gi, gi
ire ugha?
120:4 Àkú dị nkọ nke ndị dike, Ha na icheku osisi junipa.
ABÙ ỌMA 120:5 Ahuhu gādirim, na anọm dika ọbìa na Mek, na Mu onwem nēbi n'ulo-ikwū nile nke Kida!
ABÙ ỌMA 120:6 Ogologo oge di anya ka nkpuru-obim nēbiyere onye nākpọ udo asì.
120:7 Mu onwem bu nke udo: ma mb͕e m'nēkwu, ha bu ibu agha.