Abụ Ọma
113:1 Toonụ Jehova. Tonu, unu ndi-orù Jehova, tonu aha
nke Jehova.
113:2 Onye agọziri agọzi ka aha Jehova bu site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.
ABÙ ỌMA 113:3 Site n'ọwuwa-anyanwu rue ọdida-anyanwu nke Jehova
a ga-eto aha.
113:4 Jehova di elu n'elu mba nile, Ọ bu kwa ebube-Ya n'elu elu-igwe nile.
ABÙ ỌMA 113:5 Ònye di ka Jehova, bú Chineke-ayi, Onye nēbi n'elu?
113:6 Onye na-eweda onwe ya ala ịhụ ihe ndị dị n’elu-igwe na n’ime i
ụwa!
113:7 Ọ nēbuli onye ewedara n'ala site n'ájá, Ọ nēbuli kwa ob͕eye n'ala
ogwugwu;
113:8 Ka o we guzo ya n'etiti ndi-isi, Ọbuná n'etiti ndi-isi nke ndi-Ya.
113:9 Ọ nēme nwanyi-àgà ka ọ buru ulo, na iburu nne nke nāṅuri ọṅu
umuaka. Toonu Jehova.