Abụ Ọma
108:1 Chineke, obi m edoziwo; M'gābù abù, nye kwa otuto, ọbuná Mu onwem
ebube.
108:2 Teta, une na ubọ-akwara: Mu onwem gēteta n'isi-ututu.
ABÙ ỌMA 108:3 Jehova, ka m'gēkele Gi n'etiti ndi nile di iche iche: M'gābù kwa abù ọma
Nye gi n'etiti mba nile.
108:4 N'ihi na ebere-Gi di uku n'elu elu-igwe: ezi-okwu-Gi eruwo kwa
igwe ojii.
108:5 Ka I di elu, Chineke, n'elu elu-igwe nile: Na ebube-Gi n'elu ihe nile
ụwa;
ABÙ ỌMA 108:6 Ka ewe b͕apu onye ihe-ya nātọ utọ: Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa
m.
108:7 Chineke ekwuwo okwu n'ịdị nsọ Ya; M'gāṅuri kwa ọṅu, m'gēkè Shekem;
t'unu kwa ta alị-a;
108:8 Gilead bụ nke m; Manase bu nkem; Ifrem bụkwa ike nke m
isi; Juda bu onye nēnyem iwu;
108:9 Moab bu ite ọsa; n'elu Edom ka m'gātupu akpukpọ-ukwum; n'elu Filistia
aga m emeri.
108:10 Ònye gēme ka m'bata n'obodo siri ike? ònye gēdubàm ba n'Edom?
ABÙ ỌMA 108:11 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, Onye juworo ayi aju? ma Gi onwe-gi, Chineke, agaghi-aga
soro ndi-agha ayi pua?
108:12 Nye ayi aka site na nkpab͕u: N'ihi na ihe-efu ka iye-aka madu bu.
108:13 Site na Chineke anyị ga-eme ihe dị ike: n'ihi na ọ bụ ya ga-azọda
ndị iro anyị.