Abụ Ọma
ABÙ ỌMA 100:1 Tikuenu Jehova nkpu ọṅù, unu ala nile.
ABÙ ỌMA 100:2 Werenu ọṅù fè Jehova òfùfè: werenu iti-nkpu bia n'iru Ya.
ABÙ ỌMA 100:3 Maranu na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke: Ọ bu Ya mere ayi, ma Ọ bughi ayi
anyị onwe anyị; ayi bu ndi-Ya, na aturu nke ebe-ita-nri-Ya.
ABÙ ỌMA 100:4 Were kwa ekele ba n'ọnu-uzọ-ama-Ya nile, Were kwa otuto ba n'ogige-Ya nile;
kelenu Ya, gọzie kwa aha-Ya.
100:5 N'ihi na Jehova di nma; Ebere ya na-adịru mgbe ebighị ebi; ezi-okwu-Ya nādi kwa
rue ọgbọ nile.