Abụ Ọma
ABÙ ỌMA 95:1 Bianu, ka ayi bùkue Jehova abù: Ka ayi tikue Jehova nkpu ọṅù
oké nkume nke nzọpụta anyị.
ABÙ ỌMA 95:2 Ka ayi were ekele bia n'iru Ya, we ṅuria ọṅu
were abù ọma kpọkue Ya.
95:3 N'ihi na Jehova bụ Chineke dị ukwuu, na Eze dị ukwuu karịa chi niile.
95:4 N'aka-Ya ka ebe nile miri emi nke uwa di: Ebe siri ike nke ugwu nile
bụkwa nke ya.
ABÙ ỌMA 95:5 Oké osimiri bu Ya nwe ya, O me-kwa-ra ya: Ọbu-aka-Ya we kpua ala-akọrọ.
ABÙ ỌMA 95:6 Bianu, ka ayi kpọ isi ala, rube isi: ka ayi b͕ue n'ala n'iru Jehova-ayi
onye na-eme ihe.
95:7 N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi; ma ayi onwe-ayi bu ndi-ebe-ita-nri-Ya, na aturu
nke aka ya. ta ọ buru na unu anu olu-Ya;
95:8 Unu emela ka obi unu sie ike, dị ka n'ime mkpasu iwe, na dị ka n'ụbọchị nke
onwunwa n'ime ozara:
ABÙ ỌMA 95:9 Mb͕e nna-unu-hà nwaram, we nwam, hu ọlum.
95:10 Ọgu arọ abua ka m'we wutere ọb͕ọ a, si, Ọ bu a
ndi nēhie uzọ n'obi-ha, ma ha amaghi uzọm nile;
95:11 Ndi M'ṅuru iyi n'ọnumam ka ha ghara ibà n'izu-ikem.