Abụ Ọma
87:1 Ntọ-ala-Ya di n’ugwu nsọ.
ABÙ ỌMA 87:2 Jehova nāhu ọnu-uzọ-ama nile nke Zaion n'anya kari ebe-obibi nile nke Jekob.
87:3 Ihe dị ebube ka a na-ekwu maka gị, obodo Chineke. Selah.
87:4 M'gēhota kwa Rehab na Babilon nye ndi maram: le
Filistia, na Taia, na Etiopia; nwoke a ka amuru n'ebe ahu.
87:5 Ma agēsi kwa Zaion, si, Onye a na nwoke ahu ka amuru nime ya;
Onye kasị elu n'onwe ya ga-eme ka o guzosie ike.
87:6 Jehova gāgu kwa, mb͕e O nēde ndi Israel n'akwukwọ, na nwoke a bu
amuru ebe ahu. Selah.
87:7 Ọzọ kwa, ndi-ọbù-abù, na ndi-ọb͕ọ-arọ, gādi kwa n'ebe ahu: M
isi-iyi di nime gi.