Abụ Ọma 87:1 Ntọ-ala-Ya di n’ugwu nsọ. ABÙ ỌMA 87:2 Jehova nāhu ọnu-uzọ-ama nile nke Zaion n'anya kari ebe-obibi nile nke Jekob. 87:3 Ihe dị ebube ka a na-ekwu maka gị, obodo Chineke. Selah. 87:4 M'gēhota kwa Rehab na Babilon nye ndi maram: le Filistia, na Taia, na Etiopia; nwoke a ka amuru n'ebe ahu. 87:5 Ma agēsi kwa Zaion, si, Onye a na nwoke ahu ka amuru nime ya; Onye kasị elu n'onwe ya ga-eme ka o guzosie ike. 87:6 Jehova gāgu kwa, mb͕e O nēde ndi Israel n'akwukwọ, na nwoke a bu amuru ebe ahu. Selah. 87:7 Ọzọ kwa, ndi-ọbù-abù, na ndi-ọb͕ọ-arọ, gādi kwa n'ebe ahu: M isi-iyi di nime gi.