Abụ Ọma
82:1 Chineke nēguzo n'etiti ndi-dike; Ọ nēkpe ikpe n'etiti ndi-Ju
chi.
ABÙ ỌMA 82:2 Rùe ole mb͕e ka unu ganēkpe ikpe n'ajọ omume, na n'iru ndi nēmebi iwu ka unu nātọ utọ?
Selah.
ABÙ ỌMA 82:3 Zọchita-kwa-ra ob͕eye na nwa-nb͕ei: Menu onye ewedara n'ala na ob͕eye ezi omume.
82:4 Naputa ndi ewedara n'ala na ob͕eye: Naputa ha n'ọbu-aka ndi nēmebi iwu.
82:5 Ha amaghi, ha agaghi-aghọta kwa; ha nējeghari n'ọchichiri:
ntọ-ala nile nke uwa agabigawo n'ezie.
82:6 Asiwom, Chi ka unu bu; unu nile bu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu.
82:7 Ma unu ga-anwụ dị ka mmadụ, na-ada dị ka otu n'ime ndị isi.
82:8 Bilie, Chineke, kpe uwa ikpe: N'ihi na I gēnweta mba nile.