Abụ Ọma
ABÙ ỌMA 71:1 Na Gi, Jehova, ka m'tukwasiworo obi: Ekwela ka m'tie n'ọnọdu-ihere rue mb͕e ebighi-ebi.
ABÙ ỌMA 71:2 Naputam n'ezi omume-Gi, me ka m'we b͕apu: chilata nke Gi
ṅanum nti, zọputakwam.
71:3 Gi onwe-gi buru ebe-obibim siri ike, ebe M'nāb͕abà nime ya mb͕e nile: Gi
enyewo iwu izọputam; N'ihi na Gi onwe-gi bu oké nkumem na ebem ewusiri ike.
71:4 Chineke m, napụta m n'aka ndị ajọ omume, n'aka nke
onye ajọ omume na obi-ebere.
71:5 N'ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova: Gi onwe-gi bu ntukwasi-obim site na nwata.
ABÙ ỌMA 71:6 Ọ bu Gi ka ejiworo welim elu site n'àkpà-nwa: Gi onwe-gi bu Onye kurum
site n'afọ nnem: otutom gādi site na Gi mb͕e nile.
71:7 Mu onwem di ka ihe-ebube nye ọtutu madu; ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm siri ike.
ABÙ ỌMA 71:8 Ka ọnum juputa n'otuto-Gi na nsọpuru-Gi ubọchi nile.
71:9 Achupulam na mb͕e agadi; Ahapụla m mgbe ike m
ada ada.
71:10 N'ihi na ndi-irom nēkwu okwu megidem; na ndi nēchere nkpuru-obim
gbakọtanụ ndụmọdụ;
71:11 si, Chineke arapuwo Ya; n'ihi na ọ dighi
ịnapụta ya.
71:12 Chineke, anọla n'ebe m nọ: Chinekem, me ngwa inye akam.
71:13 Ka ihere me ha, me ka ha gwusia, bú ndi nākpab͕u nkpuru-obim; ka
Ekpuchiwo ha n'ita-uta na ihe-ihere, bú ndi nāchọ imejọm.
71:14 Ma m ga-ele anya mgbe nile, na m ga-etokwa gị ọzọ na nke ukwuu.
71:15 Ọnum ga-egosi ezi omume gị na nzọpụta gị niile
ụbọchị; n'ihi na amaghim ọnu-ọgugu-ya.
71:16 M'gāla n'ike nke Onye-nwe-ayi Jehova: M'gēhota okwu-Gi
ezi omume, ọbuná nke nání Gi.
ABÙ ỌMA 71:17 Chineke, I zíwom ihe site na nwata: Ma rue ub͕u a ka m'gosiworo
oké ọlu-Gi nile.
71:18 Ma mb͕e m'meworo agadi na isi-awọ, Chineke, arapulam; ruo mgbe m
E gosiwo ọb͕ọ a ike-Gi, gosi kwa ike-Gi nye onye ọ bula
nke gaje ibia.
71:19 Ọzọ, ezi omume-Gi, Chineke, di elu nke-uku, Onye meworo ihe uku;
Chineke, ònye di ka Gi!
71:20 Gi onwe-gi, onye gosiworom oké na nkpab͕u di ike, M'gēme ka m'di ndu
ọzọ, na ị ga-akpọlitekwa m ọzọ site na omimi nile nke ụwa.
71:21 Ị ga-amụba ịdị ukwuu m, na-akasi m obi n'akụkụ nile.
ABÙ ỌMA 71:22 M'gēji kwa une kele Gi, bú ezi-okwu-Gi, Chinekem.
M'gēji ubọ-akwara bùkue gi abù, Gi Onye Nsọ nke Israel.
71:23 Eb͕ub͕ere-ọnum abua gāṅuri ọṅu nke-uku mb͕e m'gābùkue Gi abù; na nkpuru-obim, nke
I b͕aputaworo.
71:24 Irem gēkwu kwa okwu bayere ezi omume-Gi ogologo ubọchi nile: n'ihi na
ihere emewo ha, n'ihi na emewo ka ihere me ha, bú ndi nāchọ imejọm.