Abụ Ọma
69:1 Chineke, zọpụta m; n'ihi na miri abàwo nime nkpuru-obim.
ABÙ ỌMA 69:2 N'urọ di omimi ka m'mikpuworo, ebe ọ nādighi-eguzo ọtọ: Abàwom n'ebe di omimi
miri, ebe miri-iyi nērubigara m ókè.
ABÙ ỌMA 69:3 Ike gwuwom n'ikwa-ákwám: akpirim akpọwo akpọnwu: Anyam abua ada ada mb͕e m'nēchere
maka Chinekem.
ABÙ ỌMA 69:4 Ndi nākpọm asì n'efu di ọtutu kari agiri-isi nile nke isim;
ndi nāchọ ibibim, ebe ha bu ndi-irom n'ikpe-azu, di ike;
M'we nyeghachi ihe nke m'nānapughi.
69:5 Chineke, I mara nzuzum; ma nmehiem nile ezonarighi Gi.
ABÙ ỌMA 69:6 Ka iherem ghara ime ndi nēle anya Gi, Jehova, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha
n'ihi: ekwela ka ihere me ndi nāchọ Gi ka ihere me ha n'ihim, Chineke nke
Israel.
69:7 N'ihi na n'ihi Gi ka m'buworo ita-uta; ihere ekpuchiwo irum.
ABÙ ỌMA 69:8 Aghọwom onye-ọbìa nye umu-nnem, na onye-ọbìa n'ebe nnem nọ.
umuaka.
69:9 N'ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom; na ihe-ita-uta nile nke ha
ndi nāta Gi uta adakwasim.
69:10 Mgbe m na-akwa ákwá, were obubu ọnụ na-ata mkpụrụ obi m ahụhụ, nke ahụ bụ m
nkọcha.
69:11 M'we me kwa uwe-nkpe; m'we ghọrọ ha ilu.
69:12 Ndi nānọdu ala n'ọnu-uzọ-ama nēkwu okwu megidem; Mu onwem bu kwa abù Jehova
ndị aṅụrụma.
ABÙ ỌMA 69:13 Ma mu onwem, ekperem di Gi, Jehova, na mb͕e ọ nātọ utọ:
Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi, zam, n'ezi-okwu nke Gi
nzọpụta.
ABÙ ỌMA 69:14 Naputam n'apiti, ekwe-kwa-la m'mikpu miri: ka ewe naputam
site n'aka ndi nākpọm asì, na site na miri nke miri emi.
ABÙ ỌMA 69:15 Ka iju-miri ahu ghara irukwasim, Ka ob͕u-miri ghara kwa ilom;
ekwela ka olùlù-ya mechie ọnu-ya megidem.
69:16 Jehova, zam; n'ihi na ebere-Gi di nma: Dika irum laghachikute
Nye ba uba nke obi-ebere-Gi nile.
69:17 Ezonari-kwa-la iru-Gi n'iru orù-Gi; n'ihi na anọm n'ahuhu: zam
ngwa ngwa.
69:18 Biarue nkpuru-obim nso, b͕aputa kwa ya: naputam n'ihim
ndị iro.
ABÙ ỌMA 69:19 I mara ita-utam, na iherem, na iherem;
ndi-nkpab͕u nile di n'iru Gi.
69:20 Ita-uta etiwawo obim; ma obi juwom n'aru: m'we hu
ka ụfọdụ nwee obi ebere, ma ọ dịghị; na maka ndị nkasi obi, ma m
ahụghị nke ọ bụla.
69:21 Ha nye-kwa-ram ga-nri ka ọ buru ihe-oriri; na n'akpiri-ikpọ-nku ka ha nyerem
mmanya ọṅụṅụ.
69:22 Ka table-ha ghọ ọnyà n'iru ha, na ihe kwesiri inwe
bụrụ maka ọdịmma ha, ka ọ bụrụ ọnyà.
69:23 Ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu; ma mee úkwù ha
na-aga n'ihu ịma jijiji.
ABÙ ỌMA 69:24 Wukwasi ha iwe-Gi;
jide ha.
69:25 Ka ebe-obibi-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; ka onye ọ bula ghara kwa ibi n'ulo-ikwū-ya.
69:26 N'ihi na ha na-akpagbu onye I tib͕uru; na ha na-ekwurịta okwu
iru-újú nke ndi I mejọworo.
69:27 Tukwasi ajọ omume n'ajọ omume-ha: Ka ha ghara kwa ibà nime Gi
ezi omume.
69:28 Ka e hichapụ ha n'akwụkwọ nke ndị dị ndụ, na-agaghị ede
ya na ndi ezi omume.
69:29 Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye nēwuta: Chineke, ka nzọputa-Gi tukwasim
elu.
69:30 M'gēji abù to aha Chineke, were kwa ito ya uku
ekele.
69:31 Nka gātọ kwa Jehova utọ kari ehi ma-ọbu oke-ehi nke nwere
mpi na ukwu.
69:32 Ndi di ume-ala n'obi gāhu nka, we ṅuria: obi-unu gādi kwa ndu nke ahu
chọọ Chineke.
69:33 N'ihi na Jehova nānu ndi-ob͕eye, Ọ dighi-eleda kwa ndi-nkpọrọ-Ya anya.
69:34 Ka elu-igwe na ụwa to Ya, oké osimiri, na ihe nile
ịkwaga n'ime ya.
69:35 N'ihi na Chineke gāzọputa Zaion, wu kwa obodo nile nke Juda;
nwere ike ibi n'ebe ahụ, nweta ya.
69:36 Ọzọ, nkpuru nke ndi-orù-Ya gēketa ya: Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya
aha gēbi nime ya.