Abụ Ọma
63:1 Chineke, Gi onwe-gi bu Chinekem; n'isi-ututu ka m'gāchọ Gi: akpiri kpọrọ nkpuru-obim akpiri
gi, anu-arum nāgusi gi ike n'ala kpọrọ nku na nke akpiri-ikpọ-nku, ebe ọ dighi
mmiri bụ;
63:2 Ihu ike-Gi na ebube-Gi, otú a ka m'huworo Gi n'ebe nsọ.
ABÙ ỌMA 63:3 N'ihi na ebere-Gi di nma kari ndu, Eb͕ub͕ere-ọnum abua gēto
gi.
63:4 Otú a ka m'gāgọzi gi mb͕e m'di ndu: M'gēweli kwa ọbu-akam abua n'aru Gi
aha.
63:5 Afọ gēju nkpuru-obim dika umi na abuba; na ọnụ m
gēwere eb͕ub͕ere-ọnu nātọ utọ kele Gi;
ABÙ ỌMA 63:6 Mb͕e m'nēcheta Gi n'elu ihe-ndinam, M'we tugharia uche na Gi n'abali
ese.
63:7 N'ihi na I buwo onye-iye-akam, Ya mere n'okpuru ndò nke nkù-Gi nile
m'gāṅuri ọṅu.
ABÙ ỌMA 63:8 Nkpuru-obim nēso Gi n'azu: Aka-nri-Gi nākwagidem.
63:9 Ma ndị na-achọ mkpụrụ obi m, ibibi ya, ga-aba n'ime ala
akụkụ nke ụwa.
63:10 Ha gāda site na mma-agha: ha gāburu oke-nkita-ọhia.
63:11 Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ na Chineke; onye ọ bula nke nēwere ya ṅu iyi gēme
nsọpuru: ma agēkpuchi ọnu ndi nēkwu okwu-ugha.