Abụ Ọma
62:1 N'ezie nkpuru-obim nēchere Chineke: Nzọputam si n'ebe ọ nọ bia.
62:2 Ọ bu nání Ya bu oké nkumem na nzọputam; ọ bu ihe-nkpuchim; Agaghị m abụ
kpaliri nke ukwuu.
ABÙ ỌMA 62:3 Rùe ole mb͕e ka unu gāchè ajọ omume megide madu? unu nile ka agāb͕u
unu gādi kwa ka mb͕idi nēruda ala, na dika ogige nāma jijiji.
ABÙ ỌMA 62:4 nání ha nāb͕a ìzù iweda ya n'idi-elu-ya: ihe nātọ ha utọ
okwu-ugha: ha nēji ọnu-ha gọzie, ma n'ime ka ha nākọcha. Selah.
62:5 Nkpuru-obim, chere Chineke nání Gi; n'ihi na n'aka Ya ka m'leworo anya.
62:6 Ọ bu nání Ya bu oké nkumem na nzọputam: Ọ bu ulo-elum; Agaghị m abụ
kpaliri.
62:7 N'ebe Chineke nọ ka nzọputam na ebubem di: Oké nkume nke ikem na
ebe mgbaba, di na Chineke.
62:8 Na-atụkwasịnụ Ya obi mgbe nile; wukwasinu obi-unu n'iru Ya;
Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba. Selah.
ABÙ ỌMA 62:9 N'ezie ndi di ala bu ihe-efu, Ma ndi di elu bu okwu-ugha.
ka edobe ya n'ihe-ọtùtù, ha nile di nfe karia ihe-efu.
62:10 Unu atukwasila obi n'ihe-nmeb͕u, abu-kwa-la ihe-efu n'ipunara madu ihe: ọ buru na àkù
ba uba, unu atulakwasi ha obi-unu.
62:11 Chineke ekwuwo otu ugboro; ugboro abụọ ka m nụrụ nke a; na ike nwe ya
Chineke.
62:12 Ọzọ, Gi, Jehova, nwe ebere: N'ihi na Gi onwe-gi nākwughachi madu ọ bula
dika oru ya si di.