Abụ Ọma
61:1 Chineke, nuru ntikum; ṅa nti n'ekperem.
61:2 Site na nsọtu uwa ka m'gākpọku Gi, mb͕e obim di
ihe-ike: durum jerue nkume di elu karim.
61:3 N'ihi na I buworom ebe-nb͕abà, na ulo-elu siri ike n'aka onye-iro.
61:4 N'ulo-ikwū-Gi ka m'gānọgide rue mb͕e ebighi-ebi: N'ebe-nzuzo ka m'gātukwasi obi
nku gi. Selah.
ABÙ ỌMA 61:5 N'ihi na Gi onwe-gi, Chineke, anuwo nkwam nile;
ndi nātu egwu aha-Gi.
ABÙ ỌMA 61:6 I gēme ka ndu eze di ogologo, Ọb͕ọ-ya ka arọ-ya gādi kwa.
ABÙ ỌMA 61:7 Ọ gānọgide n'iru Chineke rue mb͕e ebighi-ebi: Dozie ebere na ezi-okwu;
chebe ya.
ABÙ ỌMA 61:8 M'gābùku kwa aha-Gi abù rue mb͕e ebighi-ebi, Ka m'we me kwa ubọchi nile
nkwa m.