Abụ Ọma
ABÙ ỌMA 43:1 Kpem ikpe, Chineke, kpe kwa ikpem ikpe megide mba nāsọpuru Chineke: naputa
mu onwem si n'aka onye-nghọb͕u na onye ajọ omume.
43:2 N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke ikem: gini mere I nājum? gịnị kpatara m ji aga
na-eru uju n'ihi mmegbu nke ndị iro?
ABÙ ỌMA 43:3 Ziputa ìhè-Gi na ezi-okwu-Gi: Ka ha durum; ka ha wetaram
rue ugwu nsọ Gi, ru kwa ulo-ikwū-Gi nile.
ABÙ ỌMA 43:4 M'gābà kwa n'ebe-ichu-àjà nke Chineke, biakute Chineke ọṅùm nke-uku: e,
N'ubọ-akwara ka m'gēkele Gi, Chineke, bú Chinekem.
ABÙ ỌMA 43:5 N'ìhi gini ka i nēweda n'ala, nkpuru-obim? gini mere obi nālọ gi miri?
m? Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputam
iru, na Chinekem.