Abụ Ọma
41:1 Ngọzi nādiri onye nātukwasi uche n'ob͕eye: Jehova gānaputa ya nime
oge nsogbu.
ABÙ ỌMA 41:2 Jehova gēdebe kwa ya, me ka ọ di ndu; ọ gābu kwa onye agọziri agọzi
n'elu uwa: ma i gaghi-arara ya nye n'aka ihe Ọ nāchọ
ndị iro.
41:3 Jehova gēme kwa ya ka ọ di ike n'elu ihe-ndina nke nkpab͕u: I gēme
ihe-ndina-ya nile n'ọria-ya.
41:4 M'siri, Jehova, merem ebere: me ka nkpuru-obim di ike; n'ihi na emehiewom
imegide gi.
41:5 Ndi-irom nēkwu okwu ọjọ bayerem, si, Òle mb͕e ọ gānwu, na aha-ya gāla kwa n'iyì?
41:6 Ma ọ buru na ọ bia ihum, ọ nēkwu ihe-efu: obi-ya nāchikọta
ajọ omume nye onwe ya; mb͕e ọ nāpu n'èzí, ọ nēgosi ya.
ABÙ ỌMA 41:7 Ndi nile nākpọm asì nēkwusa n'otù imegidem: Mu onwem ka ha nēchè èchìchè
m merụrụ.
41:8 Ọria ọjọ, ka ha nāsi, nārapara n'aru Ya: Ma ub͕u a ọ nēkwu okwu-ugha
ọ gaghi-ebili ọzọ.
41:9 E, enyim nke m'mara nke-ọma, Onye m'tukwasiworo obi, Onye nēri ufọdu nimem
nri, emewo ka ikiri-ukwu-Ya elu imegidem.
ABÙ ỌMA 41:10 Ma Gi onwe-gi, Jehova, merem amara, me ka m'bilie, ka m'we me
kwụọ ha ụgwọ.
41:11 Site na nke a ka m ji mara na ị na-emere m amara, n'ihi na onye iro m adịghị eme
merie m.
ABÙ ỌMA 41:12 Ma Mu onwem, I nākwagidem n'izu-okèm, I nēdozikwam.
n'iru Gi rue mb͕e ebighi-ebi.
41:13 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu site na mb͕e ebighi-ebi, na rue mb͕e ebighi-ebi.
Amen, na Amen.