Abụ Ọma
30:1 M'gēkele Gi, Jehova; n'ihi na Gi onwe-gi ebuliwo m, ma i meghi
Ndi-irom ka ha ṅuria ọṅu n'arum.
ABÙ ỌMA 30:2 Jehova, bú Chinekem, kpọkurum Gi, I we me ka aru dim ike.
30:3 Jehova, I mewo ka nkpuru-obim si n'ala-mọ rigoputa: I nēdebewom
ndu, ka m'we ghara irida n'olùlù.
ABÙ ỌMA 30:4 Bùkuenu Jehova abù, unu ndi nsọ Ya, nēkele kwa Jehova
ncheta nke idi-nsọ-Ya.
30:5 N'ihi na ọ bụ nanị otu ntabi anya ka iwe ya na-adị; n'amara ya ka ndu bu: ikwa-ákwá nwere ike
diri otù abalị, ma ọṅù nābia n'ututu.
30:6 Ma n'ọdi-nmam ka m'siri, M'gaghi-ewezuga onwe-ya ma-ọli.
30:7 Jehova, site n'amara-Gi ka I meworo ka ugwum guzosie ike: Gi
i zobewo iru-Gi, ewe tua m miri.
30:8 M'kpọkuru Gi, Jehova; ọ bu kwa Jehova ka m'riọrọ aririọ-amara.
30:9 Gini ka urù di n'ọbaram, mb͕e m'nārida n'olùlù? ga-
aja na-ekele gi? ọ̀ gākọwa ezi-okwu-Gi?
ABÙ ỌMA 30:10 Nuru, Jehova, me-kwa-ram amara: Jehova, buru onye nēyerem aka.
ABÙ ỌMA 30:11 I mewo ka iru-újúm ghọ iru-újú n'ọb͕ub͕a-agharam: I wepuwo m
ákwà-nkpe, were kwa ọṅù kem ihe-ọkiké;
30:12 Ka ebubem we tie Gi abù, ghara idi nkiti. O
Jehova, bú Chinekem, M'gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi.