Abụ Ọma
28:1 Gi ka m'gākpọku, Jehova, bú oké nkumem; agbala nkịtị n'ebe m'nọ: ka i we ghara i
b͕anum du, M'we di ka ndi nārida n'olùlù.
28:2 Nuru olu aririọ-amaram nile, mb͕e m'nākpọku Gi, mb͕e m'nēweli elu
ọbu-akam abua nēche iru ebe nsọ Gi.
28:3 Adọpulam n'aka ndi nēmebi iwu, Ya na ndi nālu ajọ ihe;
ndi nāgwa ibe-ha okwu udo, Ma ihe ọjọ di n'obi-ha.
28:4 Nye ha dị ka omume ha, na dị ka ajọ omume nke
ndọb͕u nile ha: nye ha dika ọlu aka-ha si di; nye
ha bụ ala ịkpa ha.
28:5 N'ihi na ha adịghị ele ọrụ Jehova, ma ọ bụ omume nke ya
aka, Ọ gēkpochapu ha, ma Ọ gaghi-ewuli ha elu.
28:6 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, n'ihi na Ọ nuwo olu nkem
aririọ.
28:7 Jehova bu ikem na ọtam; Obim tukwasiri obi na Ya, Mu onwem bu kwa
enyere aka: n'ihi nka obim nāṅuri nke-uku; ọ bu kwa abùm ka m'gēji
too ya.
28:8 Jehova bụ ike ha, Ọ bụkwa ike nzọpụta nke ya
e tere mmanụ.
28:9 Zọputa ndi-Gi, gọzie ihe-nketa-Gi: Ọzọ kwa, nāzù ha, welie ha elu
ha ruo mgbe ebighị ebi.