Abụ Ọma
24:1 Jehova nwe uwa na ùjú-ya; ụwa, na ha
ndi bi nime ya.
24:2 N'ihi na O tọrọ ntọala ya n'elu oké osimiri, me ka o guzosie ike n'elu
idei mmiri.
24:3 Ònye gārigo n'ugwu Jehova? ma-ọbụ onye ga-eguzo n’ime ya
ebe nsọ?
24:4 Onye nwere aka di ọcha, na obi di ọcha; Onye nēwelighi ya elu
nkpuru-obi ka ọ buru ihe-efu, Ọ bughi kwa n'aghughọ ṅuru iyi.
24:5 Ọ ga-anata ngọzi n'aka Jehova, na ezi omume n'aka Jehova
Chineke nke nzọpụta ya.
24:6 Nka bu ọb͕ọ nke ndi nāchọ Ya, ndi nāchọ iru-Gi, O
Jekọb. Selah.
24:7 Welienụ isi unu elu, unu ọnụ ụzọ ámá; ka ewelie unu elu, unu ọnu-uzọ ebighi-ebi;
Eze ebube gābata kwa.
24:8 Ònye bụ eze ebube a? Jehova di ike di uku, Jehova di ike
n'agha.
24:9 Welienụ isi unu elu, unu ọnụ ụzọ ámá; ọbuná welie ha elu, unu ọnu-uzọ ebighi-ebi;
Eze ebube gābata kwa.
24:10 Ònye bụ eze ebube a? Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ya onwe-ya bu Eze ebube.
Selah.