Abụ Ọma 20:1 Jehova za gi n'ubọchi ahuhu; aha Chineke nke Jekob chebe gi; 20:2 Si n'ebe nsọ ziga gi aka-gi, si kwa na Zaion di ike; 20:3 Cheta onyinye-inata-iru-ọma-gi nile, nara àjà-nsure-ọku-gi nile; Selah. 20:4 Nye gi dika obi-gi si di, mezu kwa ndum-ọdu-gi nile. 20:5 Ayi gāṅuri na nzọputa-Gi, Ọ bu kwa n'aha Chineke-ayi ka ayi gētiye welie ọkọlọtọ-ayi: Jehova mezu aririọ-gi nile. 20:6 Ub͕u a ka m'maworo na Jehova nāzọputa onye-Ya etere manu; Ọ gānu kwa okwu-ọnu-ya elu-igwe di nsọ, Ya na ike nzọputa nke aka-nri-Ya. 20:7 Ufọdu nātukwasi obi n'ub͕ọ-ala, ọzọ kwa n'inyinya: ma ayi gēcheta Jehova aha Jehova, bú Chineke-ayi. 20:8 Ha ewedawo da da: Ma ayi ebiliwo, guzo kwa ọtọ. 20:9 Jehova, zọputa: ka eze nuru ayi mb͕e ayi nākpọ.