Abụ Ọma
20:1 Jehova za gi n'ubọchi ahuhu; aha Chineke nke Jekob
chebe gi;
20:2 Si n'ebe nsọ ziga gi aka-gi, si kwa na Zaion di ike;
20:3 Cheta onyinye-inata-iru-ọma-gi nile, nara àjà-nsure-ọku-gi nile; Selah.
20:4 Nye gi dika obi-gi si di, mezu kwa ndum-ọdu-gi nile.
20:5 Ayi gāṅuri na nzọputa-Gi, Ọ bu kwa n'aha Chineke-ayi ka ayi gētiye
welie ọkọlọtọ-ayi: Jehova mezu aririọ-gi nile.
20:6 Ub͕u a ka m'maworo na Jehova nāzọputa onye-Ya etere manu; Ọ gānu kwa okwu-ọnu-ya
elu-igwe di nsọ, Ya na ike nzọputa nke aka-nri-Ya.
20:7 Ufọdu nātukwasi obi n'ub͕ọ-ala, ọzọ kwa n'inyinya: ma ayi gēcheta Jehova
aha Jehova, bú Chineke-ayi.
20:8 Ha ewedawo da da: Ma ayi ebiliwo, guzo kwa ọtọ.
20:9 Jehova, zọputa: ka eze nuru ayi mb͕e ayi nākpọ.