Abụ Ọma
16:1 Chineke, chebem: N'ihi na Gi ka m'tukwasiworo obi.
16:2 Nkpuru-obim, I siri Jehova, Gi onwe-gi bu Onye-nwem: idi-nmam
ọ dighi-agbatị gi;
16:3 Ma nye ndị nsọ nọ n'ụwa, na ndị magburu onwe ha
ihe niile na-atọ m ụtọ.
16:4 Nwute-ha gāba kwa uba, bú ndi nēme ngwa iso chi ọzọ di: ha
M'gaghi-echu àjà-ihe-ọṅuṅu, bú ọbara, M'gaghi-abuli kwa aha-ha
egbugbere ọnụ m.
16:5 Jehova bu òkè ihe-nketam na nke ikom: gi
chebe oke m.
ABÙ ỌMA 16:6 Udọ̀ nile adakwasiworom n'ebe di utọ; e, enwere m nke ọma
ihe nketa.
16:7 M'gāgọzi Jehova, Onye nyeworom ndum-ọdu: Akurum abua kwa idọ-aka-na-nti
m n'oge abalị.
16:8 Edowom Jehova n'irum mb͕e nile: N'ihi na Ọ nọ n'aka-nrim, M
agaghi-emeghari.
16:9 N'ihi nka obim nāṅuri, ebubem we ṅuria: anu-arum gāṅuri kwa
zuru ike n'olileanya.
16:10 N'ihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m na ala mmụọ; i gaghi-ekwe kwa nke gi
Onye Nsọ ịhụ ire ure.
16:11 I gēgosim uzọ ndu: n'iru Gi ka ọṅù di;
N'aka-nri-Gi ka ihe-utọ di rue mb͕e ebighi-ebi.