Abụ Ọma
ABÙ ỌMA 13:1 Rùe ole mb͕e ka I gēchezọm, Jehova? ruo mgbe ebighị ebi? rùe ole mb͕e ka i gēzobe
iru-gi si n'ebe m'nọ di?
13:2 Rùe ole mb͕e ka m'gāb͕a ndu nime nkpuru-obim, N'inwe ihe-nwuta n'obim
kwa ụbọchị? rùe ole mb͕e ka onye-irom gādi elu n'isim?
13:3 Tugharia uche, zam, Jehova, bú Chinekem: Menu anyam abua ìhè, ka m'we ghara iraru ura
ụra nke ọnwụ;
13:4 Ka onye-irom we ghara isi, Emeriwom imegide Ya; na ndị ahụ
na-enye m nsogbu n'obi na-aṅụrị ọṅụ ma a kpalie m.
13:5 Ma atukwasiwom obi n'ebere-Gi; obim gāṅuri nime Gi
nzọpụta.
13:6 M'gābùkue Jehova abù, n'ihi na O mesowom ihe-ọmuma.