Abụ Ọma
3:1 Jehova, lee ka ha si baa ụba na-akpagbu m! ọtutu bu ndi nēbili
megide m.
3:2 Ọtutu madu di ndi nēkwu okwu bayere nkpuru-obim, si, Ọ dighi onye-iye-aka diri ya nime Chineke.
Selah.
3:3 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta nyem; ebubem, na onye nēbuli elu
isi m.
3:4 M'jiworo olum kpọkue Jehova, O we si n'ebe nsọ Ya zam
ugwu. Selah.
3:5 Mu onwem tọb͕ọrọ n'ala, raru ura; M tetara; n'ihi na Jehova kwadorom.
3:6 M ga-agaghị atụ egwu iri puku kwuru puku ndị mmadụ, ndị e
ha onwe-ha imegidem buruburu.
3:7 Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem: N'ihi na I tib͕uwo ndi-irom nile
n'elu ntì ọkpụkpụ; I b͕ajiwo ezé ndi nēmebi iwu.
3:8 Nzọputa diri Jehova: Ngọzi-Gi di n'aru ndi-Gi.
Selah.