Ilu 9:1 Amam-ihe ewuwo ulo-ya, o we waputa ogidi-ya asa; 9:2 O b͕uwo anu-ulo-ya; ọ gwakọtawo manya-vine-ya; o nwekwara kwadebere tebụl ya. 9:3 O zigawo umu-ab͕ọghọ-ya ndinyom: Ọ nēti nkpu n'ebe di elu nke obodo, 9:4 Onye nēnweghi uche, Ya chigharia n'ebe a: ma onye nāchọ nghọta, ọ si ya, 9:5 Bianu, rie ufọdu nime nrim, ṅu kwa manya-vine nke M'gwakọtara. 9:6 Rapu ndi-nzuzu, di ndu; je kwa n'uzọ nghọta. 9:7 Onye nāba onye nākwa emò nba nānara onwe-ya ihere; Onye nēmebi iwu nāba mba nānara onwe-ya nticha. ABÙ ỌMA 9:8 Abarala onye nākwa emò mba, ka ọ we ghara ikpọ gi asì: ba onye mara ihe nba, ọ gāgabiga kwa ya. hụrụ gị n'anya. 9:9 Nye onye mara ihe aka na nti, ọ gāmara kwa kari: zí onye ezi omume madu, ọ gāba kwa uba n'akwukwọ. 9:10 Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe: na ihe ọmụma nke Onye nsọ bu nghọta. 9:11 N'ihi na site na m ụbọchị gị ga-aba ụba, na afọ nke ndụ gị ga- ka-abawanye. 9:12 Ọ buru na i mara ihe, i gāmara onwe-gi: ma ọ buru na i nākwa emò. nání gi gēbu ya. 9:13 Nwanyi-nzuzu nāb͕ọ uja: ọ bu onye nēnweghi uche, ọ dighi kwa ihe nāmaghi. 9:14 N'ihi na ọ nānọdu n'ọnu-uzọ ulo-ya, N'oche n'ebe di elu nke obodo, 9:15 Ịkpọ ndị njem na-aga nke ọma n'ụzọ ha: 9:16 Onye nēnweghi uche, Ya chigharia n'ebe a: ma onye nāchọsi ike nghọta, ọ si ya, 9:17 Mmiri e zuru ezu na-atọ ụtọ, achịcha a na-eri na nzuzo dịkwa ụtọ. 9:18 Ma ọ maghị na ndị nwụrụ anwụ nọ n'ebe ahụ; na na ndị ọbịa ya nọ omimi nke hell.