Ọnụọgụ ỌPUPU 1:1 Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, n'ala-ya ulo-ikwū nzute, n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, nime n'arọ nke-abua ka ha siri n'ala Ijipt puta, si, 1:2 Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, emesia ab͕uru-ha, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu nke ha aha, nwoke ọ bula dika nghoputa-ya si di; 1:3 Site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha n'Israel: gi onwe-gi na Eron gāgu-kwa-ra ha dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. 1:4 Ma unu ga-enwe otu nwoke nke ebo ọ bụla; onye ọ bụla isi nke ulo nna-ya. 1:5 Ma ndia bu aha ndikom ahu ndi nēguzo n'etiti unu: nke Jehova ebo Reuben; Elizua nwa Shedeua. 1:6 nke Simiọn; Shelumiel nwa Zurishadai. 1:7 Nke Juda; Nahshon nwa Aminadab. 1:8 nke Isaka; Netaneel nwa Zua. 1:9 nke Zebulun; Eliab nwa Helọn. 1:10 Nke umu Josef: nke Efraim; Elishama nwa Amihud: nke Manase; Gameliel nwa Pedahzua. 1:11 nke Benjamin; Abidan nwa Gideoni. 1:12 nke Dan; Ahieza nwa Amishadai. 1:13 nke Asha; Pagiel nwa Ọkran. 1:14 nke Gad; Eliasaf nwa Deuel. 1:15 nke Naftali; Ahaịra nwa Inan. 1:16 Ndia bu ndi amara aha-ha n'ọgbakọ, ndi-isi nke ebo nile nke ndi bu nna-ha, ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri n'Israel. ỌPUPU 1:17 Moses na Eron we chiri ndikom ahu ndi edeworo aha n'aha-ha: ỌNU-ỌGUGU 1:18 Ha we chikọta nkpọkọta ahu nile n'ubọchi mbu nke Jehova ọnwa nke-abua, ha we kwuputa ufọdu nime ha dika ab͕uru nile ha si di, site ulo nke ndi bu nna-ha, dika ọnu-ọgugu aha si di, site na ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, site na ntụli aka ha. 1:19 Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka ọ gukọtara ha n'ọzara nke Saịnaị. 1:20 na umu Reuben, bú ọkpara Israel, dika osuso-ọmumu nile ha si di; dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika Jehova si di ọnu-ọgugu aha, dika isi-ha si di, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ na n'elu, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha; 1:21 Ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Reuben, bu puku iri anọ na isii na narị ise. 1:22 Nke umu Simeon, dika osuso-ọmumu nile ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-ha agukọtara agukọta; dika ọnu-ọgugu aha si di, n'isi-ha, nwoke ọ bula sitere onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha; 1:23 Ndi-ha agukọtara agukọta, bú ndi sitere n'ebo Simeon, bu puku iri ise na itoolu na narị atọ. 1:24 Nke umu Gad, dika osuso-ọmumu nile ha si di, dika ab͕uru nile ha si di, n' ulo nke ndi bu nna-ha, dika ọnu-ọgugu aha si di, site na onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha; 1:25 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Gad, di ọgu abua na nnù ise na ọgu iri-na-abua na iri. ỌNU-ỌGUGU 1:26 Nke umu Juda, dika osuso-ọmumu nile ha si di, dika ab͕uru nile ha si di, site ulo nke ndi bu nna-ha, dika ọnu-ọgugu aha si di, site na onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha; 1:27 Ndi-ha agukọtara agukọta, bú ndi sitere n'ebo Juda, bu na nnù iri-na-asatọ na iri na anọ. 1:28 nke umu Isaka, dika osuso-ọmumu nile ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ọnu-ọgugu aha si di; site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha; 1:29 Ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Isaka, bu puku iri ise na anọ na narị anọ. 1:30 Nke umu Zebulun, dika osuso-ọmumu nile ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ọnu-ọgugu aha si di; site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha; 1:31 Ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Zebulun, bu puku iri ise na asaa na narị anọ. 1:32 Nke umu Josef, bú nke umu Efraim, dika ha si di ọb͕ọ nile, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di; dika ọnu-ọgugu aha si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru; ndị nile nwere ike ịpụ n’agha; 1:33 Ndi-ha agukọtara agukọta, bú ndi sitere n'ebo Efraim, bu puku iri anọ na narị ise. 1:34 Nke umu Manase, dika osuso-ọmumu nile ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ọnu-ọgugu aha si di; site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha; 1:35 Ndi-ha agukọtara agukọta, bú ndi sitere n'ebo Manase, bu puku iri atọ na abụọ na narị abụọ. 1:36 Nke umu Benjamin, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di; dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ọnu-ọgugu aha si di; site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha; 1:37 Ndi-ha agukọtara agukọta, bú ndi sitere n'ebo Benjamin, bu puku iri atọ na ise na narị anọ. 1:38 nke umu Dan, dika osuso-ọmumu nile ha si di, dika ab͕uru nile ha si di, site ulo nke ndi bu nna-ha, dika ọnu-ọgugu aha si di, site na onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha; 1:39 Ndi-ha agukọtara agukọta, bú ndi diri ebo Dan, bu puku iri asaa na abụọ na narị asaa. 1:40 Nke umu Asha, dika osuso-ọmumu nile ha si di, dika ab͕uru nile ha si di, site ulo nke ndi bu nna-ha, dika ọnu-ọgugu aha si di, site na onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha; 41 ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Asha, di ọgu abua na otu puku na narị ise. 1:42 Nke umu Naftali, dika osuso-ọmumu nile ha si di, dika ha si di ab͕uru, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ọnu-ọgugu ndia si di aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpu pua agha; 1:43 Ndi-ha agukọtara agukọta, bú ndi sitere n'ebo Naftali, bu puku iri ise na atọ na narị anọ. 1:44 Ndia bu ndi agukọtara agukọta, nke Moses na Eron gukọtara, na ndi-isi Israel, ndikom iri na abua: otù nwoke diri ulo nna ya. 1:45 Otú a ka ndi nile agukọtara agukọta nke umu Israel di, site n'aka Jehova ulo nke ndi bu nna-ha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ndi nile di nwere ike ipu ibu agha n'Israel; 1:46 Ọbuná ndi nile agukọtara agukọta we di nnù na nnù iri-na-ise na atọ puku na narị ise na iri ise. 1:47 Ma ndi Livai, dika ebo nke ndi bu nna-ha si di, agughi ha n'etiti ha. 1:48 N'ihi na Jehova gwara Moses okwu, si, ỌNU-ỌGUGU 1:49 Nání na i ga-aguta ebo Livai, gua kwa ọnu-ọgugu ha n'etiti umu Israel: 1:50 Ma i gēdo ndi Livai ndi-isi ulo-ikwū ihe-àmà, na n'elu ihe-ya nile, na n'elu ihe nile nke ya; ha gēbu ebe-obibi ahu na ihe-ya nile; na ha gējere ya ozi, ma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ahu. 1:51 Ma mb͕e ebe-obibi ahu nēbuli elu, ndi Livai gēweda ya. ma mb͕e anēwu ulo-ikwū ahu, ndi Livai gēguzo ya ọtọ; ma ọbìa nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua. 1:52 Umu Israel gāma kwa ulo-ikwū-ha, nwoke ọ bula nke aka ya ọmuma-ulo-ikwū, na nwoke ọ bula n'akuku ọkọlọtọ-ya, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. 1:53 Ma ndi Livai gāma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ihe-àmà ahu; ka iwe we ghara idikwasi nkpọkọta umu Israel; ndi Livai gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe-obibi ihe-àmà. 1:54 Umu Israel we me dika ihe nile si di nke Jehova nyere n'iwu Moses, otú ahụ ka ha mere.