Nehemaịa 9:1 Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa a ka umu Israel chiri obubu-ọnu, na uwe-nkpe, na ájá di n'elu ha zukọta. 9:2 Nkpuru nke Israel we kewapu onwe-ha n'aru ndi ala ọzọ nile, na guzoro kwupụta mmehie ha nile, na ajọ omume nile nke ndị nna ha. 9:3 Ha we bilie n'ọnọdu-ha, gua n'akwukwọ iwu Jehova Jehova, bú Chineke-ha, otù uzọ n'uzọ anọ nke ubọchi; ha bu kwa uzọ anọ kwuputa, we kpọ isi ala nye Jehova, bú Chineke-ha. 9:4 Mb͕e ahu guzoro n'elu ihe-nrigo, nke ndi Livai, Jeshua, na Bani; Kadmiel, na Shebanaya, na Buni, na Sherebia, na Bani, na Kenani, we tie nkpu. oké olu kpọkue Jehova, bú Chineke-ha. 9:5 na ndi Livai, Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabnaia, na Sherebaia; Hodija na Shebanaya na Petahia we si, Bilie, gọzie Jehova Chineke-gi rue mb͕e nile ebighi-ebi: Ọ bu kwa onye agọziri agọzi ka aha-Gi di nsọpuru Eweliri elu kari ngọzi na otuto nile. 9:6 Gi onwe-gi, ọbuná Gi onwe-gi, nání Jehova; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe elu-igwe, na usu-ha nile, na uwa, na ihe nile nke di nime ya, oké osimiri nile, na ihe nile nke di nime ya, I we chebe ha niile; Usu-ndi-agha nke elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi. 9:7 Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke, Onye rọputara Abram, me ka ọ bia site na Ua nke ndi Kaldea, we kpọ ya aha Abraham; 9:8 I we hu na obi-ya kwesiri ntukwasi-obi n'iru Gi, I we b͕a ndu o we nye ala ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi Jebus, na ndi-Giagashait, inye ya, I si, gwa nkpuru-ya, me ka okwu-gi guzosie ike; n'ihi na onye ezi omume ka i bu: 9:9 Ihu-kwa-ra nweda-n'ala nke nna-ayi-hà n'Ijipt, we nu ha tie mkpu n'akụkụ Oké Osimiri Uhie; 9:10 I we me ihe-iriba-ama na ọlu-ebube n'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile; ọdakwasi kwa ndi nile nke ala-ya: n'ihi na i mara na ha mere ihe na-anya isi megide ha. I we nweta aha-gi, dika ọ di ta. 9:11 I kewara oké osimiri n'iru ha, nke mere na ha gabiga n'etiti n'etiti oké osimiri n'elu ala-akọrọ; I we tuda ndi nēsob͕u ha N'ime ob͕u-miri, dika nkume nime miri di uku. 9:12 Ọzọ, I nēdu ha n'ehihie n'ogidi igwe-oji; na n'ime Abali n'akuku ogidi ọku, inye ha ìhè n'uzọ ha nime ya kwesịrị ịga. 9:13 I ridata-kwa-ra n'ugwu Sainai, we si na ha kpayere ha uka elu-igwe, nye ha ikpé ziri ezi, na ezi iwu, ezi ukpuru na iwu-nsọ: 9:14 I we me ka ha mara ubọchi-izu-ike di nsọ Gi, I we nye ha iwu ikpé, ukpuru, na iwu nile, site n'aka Moses, bú orù-gi; 9:15 I we nye ha nri sitere n'elu-igwe n'ihi agu-ha, we muputa miri si na nkume di elu nye ha n'ihi akpiri-ikpọ-nku-ha, we kwere ha nkwa ka ha we ba inweta ala ahu nke I ṅuru iyi nye nye ha. 9:16 Ma ha na nna-ayi-hà mere nganga, na-ekwesi olu ha, na egeghi nti n'iwu-Gi nile; 9:17 Ma ọ juru inu; n'etiti ha; ma ha mere ka olu ha sie ike, ma n’ime nnupụ-isi ha họpụtara a onye-isi ilaghachi n'orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nāb͕aghara ab͕aghara; Onye amara na onye-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ngwa ngwa, di uku kwa ebere, na arapughi ha. 9:18 Ọzọ, mb͕e ha mere onwe-ha nwa-ehi awuru awu, si, Nka bu Chineke-gi Onye mere ka i si n'Ijipt rigota, me kwa ihe-nkpasu di uku; 9:19 Ma Gi onwe-gi n'ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n'ọzara. ogidi igwe-oji ahu esighi kwa n'ebe ha nọ wezuga onwe-ya n'ehihie, iduba ha ụzọ ahụ; ọ bughi kwa ogidi ọku n'abali, ime ka ha ìhè, na ụzọ nke ha ga-esi na-eje. 9:20 I nye-kwa-ra ezi mọ-Gi idọ ha aka na nti, I nēb͕ochighi kwa manna-Gi nke si n'ọnu-ha puta, I nye-kwa-ra ha miri n'akpiri-ikpọ-nku-ha. 9:21 Ọzọ, ọgu arọ abua ka I nāzù ha n'ọzara, ha we enweghị ihe ọ bụla; uwe-ha akaghi aka nká, ukwu-ha azaghi kwa aza. 9:22 Ọzọ, I nye-kwa-ra ha ala-eze na mba di iche iche, we kewa ha rue nkuku: ha we nweta ala Saihon, na ala Jehova eze Heshbon, na ala Ọg, bú eze Beshan. 9:23 Umu-ha we ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, na we me ka ha ba n'ala ahu, nke I kwere nkwa inye ya ndi bu nna-ha, ka ha we ba nime inweta ya. 9:24 Umu-ndikom we ba, nweta ala ahu, i we ruru ala n'iru ha ndi bi n'ala ahu, bú ndi Kenean, we nye ha n'aka-ha, ha na ndi-eze-ha, na ndi ala ahu, na ha nwere ike ime ha dịka ha ga-eme. 9:25 Ha we were obodo siri ike, na ala mara abuba, we nweta ulo juputara nke ngwongwo nile, olùlù-miri egwuwara, ubi-vine, na ubi-olive, na osisi nāmi nkpuru n'uba: ha we rie, riju kwa afọ, ma abuba, ma obi-ha nātọ ha utọ n'ebere-Gi bara uba. 9:26 Otú ọ di, ha nupuru isi, we nupu isi n'aru gi, tuda iwu-Gi n'azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕aworo àmà imegide ha ka ha chigharikute Gi, ha we me ihe-nkpasu di uku. 9:27 I we nye ha n'aka ndi-iro-ha, ndi we kpasue ha iwe: na na mb͕e nkpab͕u-ha, mb͕e ha nētiku Gi; I nuru ha site n'elu-igwe; Dika ọtutu obi-ebere-Gi si di I nye-kwa-ra ha ndi-nzọputa, Onye naputaworo ha n'ọbu-aka-ha ndị iro. 9:28 Ma mb͕e ha zuru ike, ha we me kwa ihe ọjọ ọzọ n'iru Gi: ya mere I rapuru ha n'aka ndi-iro-ha, ha we nwe ha nāchi ha: ma mb͕e ha laghachiri, tikue Gi, Gi nụrụ ha site n’elu-igwe; ọtutu mb͕e ka I nānaputa kwa ha dika obi-ebere-Gi nile si di; 9:29 I we b͕a àmà megide ha, ka I we me ka ha laghachi iwu-Gi: ma ha meworo npako, ma ha egeghi nti Gi ihe nile enyere n'iwu, ma o mehieworo megide ikpé-Gi nile, (nke onye ọ bula gēme ya ga-ebi nime ha;) we sepu ubu, me ka olu-ha di ike; ma ghara inu ihe. 9:30 Ma I nagidere ha ọtụtụ afọ, na-agba akaebe megide ha site Mọ-Gi nime ndi-amuma-Gi: ma ha egeghi nti: n'ihi nka I nyewo ha n'aka ndi ala ọzọ. 9:31 Otú ọ di, n'ihi oké obi-ebere-Gi i meghi ka ebibie ha, ahapụkwala ha; n'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke amara na onye-ebere. 9:32 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, Onye uku, Nke di ike, na Chineke di egwu, onye nēdebe ọb͕ub͕a-ndu na ebere, ka nkpab͕u nile ghara idi ntà n'iru Gi, nke dakwasiworo ayi, dakwasi ndi-eze-ayi, dakwasi kwa ndi-isi-ayi, na dakwasi ayi ndi-nchu-àjà, dikwasi kwa ndi-amuma-ayi, dikwasi kwa nna-ayi-hà, dakwasi kwa ndi-gi nile; site n'ubọchi ndi-eze Asiria rue ta. 9:33 Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye ezi omume n'ihe nile ewedakwasi ayi; n'ihi na i mewo n'ezie, ma ayi emewo ajọ omume: ỌNU-ỌGUGU 9:34 Ma eze-ayi, na ndi-isi-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, ma-ọbu nna-ayi-hà, edebeghi ya iwu-Gi, egeghi kwa nti n'iwu-Gi nile na ihe-àmà-Gi nile; nke I ji b͕a àmà megide ha. 9:35 N'ihi na ha efèghị gị n'alaeze ha, na n'oké gị ezi ihe nke I nyere ha, na n'ala ahu sara mbara nke di kwa abuba nke I nyere enyewo n'iru ha, ha esighi kwa n'ajọ omume nile ha chigharia. 9:36 Le, ayi bu ndi-orù ta, na ala ahu nke I nyeworo nna-ayi-hà iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya, le, ayi bụ ndị ohu na ya: 9:37 Ọ nāmu kwa ọtutu ihe-ọmume nye ndi-eze ahu ndi I doro ndi-isi-ayi n'ihi nmehie-ayi: ọzọ kwa, ha nāchi aru-ayi na n'aru anu-ulo-ayi, n'ọchichọ-ha, ma ayi nọ n'oké nkpà. 9:38 Ma n'ihi ihe a nile, anyị na-agba ndụ kwesịrị ekwesị, na-ede ya; na anyị ndi-isi, na ndi Livai, na ndi-nchu-àjà, kaa ya akara.