Levitikọs ỌPUPU 18:1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 18:2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mu onwem bu Jehova unu Chineke. 18:3 Dika omume nke ala Ijipt, nke unu biri nime ya, unu emela me: dika omume nile nke ala Kenean si di, ebe Mu onwem nēme ka unu bia; unu emela: unu eme-kwa-la ka unu nējeghari n'ukpuru nile ha. 18:4 Unu gēme ikpém nile, debe kwa ikpém nile, ijeghari nime ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 18:5 Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile: nke ọ buru na madu me, ọ gādi ndu nime ha: Mu onwem bu Jehova. 18:6 Ọ dịghị onye ọ bụla n'ime unu ga-abịaru nso onye ọ bụla bụ onye ikwu ya, kpughee ọtọ-ha: Mu onwem bu Jehova. 18:7 Ọtọ nna-gi, ma-ọbu ọtọ nne-gi, ka i gēme ekpughela: nne-gi ka ọ bu; Ekpughela ọtọ-ya. 18:8 Ekpughela ọtọ nwunye nna-gi: ọ bu nke gi ọtọ nna. 18:9 ọtọ nwa-nne-gi, nwa-nwayi nke nna-gi, ma-ọbu nwa-nwayi nke nne-gi, ma ọ bu n'ulo amuru ya, ma-ọbu amuru ya na mba ọzọ, ọbuná ha agbala ọtọ. 18:10 Ọtọ nwa-nwayi nwa-gi nwoke, ma-ọbu nke nwa-nwayi nwa-gi nwayi, ọbuná Ekpughela ọtọ-ha: n'ihi na ha bu nke gi ọtọ. 18:11 Ọtọ nke ada nwunye nna-gi, nke nna-gi muru; nwa-nne-gi nwayi ka ọ bu, ekpughe-kwa-la ọtọ-ya. 18:12 Ekpughela ọtọ nwa-nne nna-gi: ọ bu nke gi onye ikwu nna nso. 18:13 Ekpughela ọtọ nwa-nne-gi nwayi: n'ihi na ọ bu nwanne nne-gi di nso. 18:14 Ekpughela ọtọ nwa-nne nna-gi; Abịarula nwunye-ya nso: nwa-nne nna-gi ka ọ bu. 18:15 Ekpughela ọtọ nwunye nwa-gi: ọ bu nke gi nwunye nwa; Ekpughela ọtọ-ya. 18:16 Ekpughela ọtọ nwunye nwa-nne-gi: ọ bu nke gi ọtọ nwanne. 18:17 Ekpughela ọtọ nwaanyị na nwa ya nwaanyị. ewere-kwa-la nwa-ya nwayi, ma-ọbu nwa-nwayi nwa-ya nwayi; ikpughe ọtọ-ya; n'ihi na umu-nne-ya ka ha bu: ọ bu ajọ omume. ỌNU-ỌGUGU 18:18 alụ-kwa-la nwunye nye nwa-nne-ya nwayi ka i we kpasue ya iwe, ikpughe ya ọtọ. ọtọ, n'akụkụ nke ọzọ na ndụ ya oge. 18:19 Ọzọ, abiarula nwayi nso ikpughe ọtọ-ya, dika mb͕e ewe kewapu ya n'ihi ọrurú-ya. 18:20 Ọzọ, gi na nwunye madu-ibe-gi edina-anu-aru-gi, ka were ya meru onwe-gi. 18:21 Ma ekwela ka nkpuru-gi ọ bula gabiga nime ọku rue Molek; eme-kwa-la ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova. 18:22 Gi na nwoke edina-kwa-la, dika nwunye: ihe-árú ka ọ bu. 18:23 gi na anumanu ọ bula edina, iwere ya meru onwe-gi; ọ dighi kwa nwayi ọ bula gēguzo n'iru anumanu idina ya: ọ bu mgbagwoju anya. 18:24 Unu emeru-kwa-la onwe-unu n'ihe ọ bula n'ihe ndia: n'ihi na n'ihe ndia nile emeruwo mba ndi M'chupu n'iru gi: 18:25 Ma ala emeruwo: n'ihi nka ka M'nēleta ajọ omume-ya ya, ma ala nāb͕ọputa ndi bi na ya. 18:26 Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, ma unu emela mee ihe ọ bula n'ihe-árú ndia; ọ bughi kwa nke mba nke gi, ma-ọbu ọbìa ọ bula nke nọ dika ọbìa n'etiti unu: 18:27 (N'ihi na ihe-árú ndia nile ka ndikom ala ahu meworo, nke di n'iru gi, ala ewe merua;) ỌNU-ỌGUGU 18:28 ka ala ahu we ghara ikwapu unu, mb͕e unu nēmeru ya, dika ọ b͕asara. mba ndị buru gị ụzọ. 18:29 N'ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ọ bụla n'ime ihe arụ ndị a, ọbụna mkpụrụ obi ndi nēme ha ka agēbipu n'etiti umu-nna-ha. 18:30 Ya mere, unu ga-edebe m iwu, ka unu ghara ime ihe ọ bụla Ukpuru ndia jọrọ njọ nke emere n'iru unu, na unu emeru-kwa-la onwe-unu nime ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.