Joshua ỌPUPU 19:1 Ife-nzà nke-abua we putara Simeon, bú ebo Jehova umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di: na ihe-nketa-ha nọ n'etiti ihe-nketa umu Juda. ỌPUPU 19:2 Ha we nwe n'ihe-nketa-ha: Bia-sheba, na Sheba, na Molada. 19:3 na Haza-shual, na Bala, na Azem; 19:4 na Eltolad, na Betul, na Họma; 19:5 na Ziklag, na Bet-makabot, na Hazarsusa; 19:6 na Betlebaot, na Sharuhen; obodo iri na atọ na obodo ntà ha: 19:7 Ain, Remon, na Ita, na Ashan; obodo anọ na obodo ntà ha: ỌNU-ỌGUGU 19:8 na obodo ntà nile nke di obodo ndia buruburu rue Bealat-bea; Ramat nke Ndida. Nka bu ihe-nketa nke ebo ndi umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di. 19:9 Site n'òkè nke umu Juda ka ihe-nketa nke Jehova umu Simeon: n'ihi na òkè umu Juda dibigara ókè umu Simeon we nweta ihe-nketa-ha n'ime ihe nketa ha. 19:10 Ife-nzà nke-atọ we daara umu Zebulun dika ha si di ab͕uru nile: ókè-ala nke ihe-nketa-ha we rue Sarid; 19:11 Ókè-ala-ha we rigo n'uzọ oké osimiri, na Marala, we rue Dabbashet, we rue osimiri nke di n'iru Jọkneam; 19:12 Ha si na Sarid chigharia n'akuku Iru-anyanwu n'ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa, we pua rue Daberat, rigorue Jafia; 19:13 Na site n'ebe ahụ gabiga n'ebe ọwụwa anyanwụ ruo Gitahfa, ruo Itahkazin, we pua rue Remonmetoa rue Nea; 19:14 ókè-ala ahu we b͕a ya buruburu n'akuku Ugwu rue Hanaton; ọpupu-ya di na ndagwurugwu Jiftahel: 19:15 na Katat, na Nahalal, na Shimron, na Idala, na Betlehem. obodo iri na abua na obodo ntà ha. 19:16 Nka bu ihe-nketa umu Zebulun dika ha si di ezinụlọ, obodo ndị a na obodo nta ha. 19:17 Ife-nzà nke-anọ we putara Isaka, bayere umu Isaka dika ezinụlọ ha si di. 19:18 Ókè-ala-ha we di n'akuku Jezreel, na Kesulot, na Shunem; 19:19 na Hafraim, na Shaihon, na Anaharat; 19:20 na Rabbit, na Kishion, na Abez; 19:21 na Remet, na Engannim, na En-hada, na Bet-pazez; 19:22 Ókè-ala we rue Teboa, na Shahazima, na Bet-shemesh; na ọpupu ókè-ala-ha di na Jọdan: obodo iri na isi na nke ha obodo. 19:23 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha. ỌPUPU 19:24 Ife-nzà nke-ise we putara ebo umu Asha dika ezinụlọ ha si di. 19:25 Ókè-ala-ha we buru Helkat, na Hali, na Beten, na Akshaf; 19:26 na Alamelek, na Amad, na Misheal; o we rute Kamel n'akuku Ọdida-anyanwu; ọ bu kwa Shaihorlibnat; 19:27 O chigharia n'ọwuwa-anyanwu rue Bet-dagon, rute Zebulun; na rue ndagwurugwu Iftahel n'akuku Ugwu Betemek, na Neiel, we pua rue Kabul n'aka-ekpe; 19:28 na Hebron, na Rehob, na Hamon, na Kana, we rue Zaidon uku; 19:29 Ókè-ala ahu we chigharia rue Rema, ru kwa Taia, bú obodo ewusiri ike; na ókè-ala ahu we chigharia rue Hosa; Ọpupu-ya di kwa n'oké osimiri site n'ikpere osimiri rue Akzib: 19:30 na Umma, na Efek, na Rehob: orú obodo na abua na ha obodo. 19:31 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Asha nye ab͕uru nile ha, obodo ndia na obodo ntà ha. ỌNU-ỌGUGU 19:32 Ife-nzà nke-isi putara umu Naftali, ọbuná ndi umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di. ỌPUPU 19:33 Ókè-ala-ha we site na Helef, site n'Alon rue Zaananim, na Adami; Nekeb, na Jabneel, rue Lakum; ọpupu-ya we di na Jordan: 19:34 Ókè-ala ahu we chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu rue Aznot-teboa, si n'ebe ahu pua site n'ebe ahu rue Hukok, rute Zebulun n'akuku Ndida, ma rute Asha n'akuku Ọdida-anyanwu, ru kwa Juda n'akuku Jọdan n'akuku osimiri ọwụwa anyanwụ. 35 Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hammat, na Rakat, na Chinnereth, 19:36 na Adama, na Rema, na Hezoa; 19:37 na Kedesh, na Edrei, na Enhazoa; 19:38 na Iron, na Migdalel, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; iri na itoolu obodo na obodo ntà ha. 19:39 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha. 19:40 Ife-nzà nke-asa we putara ebo umu Dan dika ezinụlọ ha si di. 19:41 Ma ókè-ala ihe-nketa-ha bu Zora, na Eshtaol, na Ishemesh, 19:42 na Shaalabin, na Ajalon, na Jetla; 19:43 na Elon, na Timnata, na Ekron; 19:44 na Elteke, na Gibbeton, na Bealat; 19:45 na Jihud, na Beneberak, na Gatrimon; 19:46 na Mejarkon, na Rakon, na ókè-ala ahu n'iru Jafo. 19:47 Ma ókè-ala umu Dan puru ha nke-ntà; umu Dan we rigo ibuso Leshem agha, were o we were ọnu mma-agha tib͕ue ya, nweta ya, biri nime ya, kpọ Leshem, Dan, dika aha Dan, bú nna-ha si di. 19:48 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha, obodo ndia na obodo ntà ha. 19:49 Ma mb͕e ha gwusiri ikesa ala ahu n'ihe-nketa site n'aka-ha ókè-ala nile ka umu Israel nyere Joshua nwa nke-nketa Nun n'ime ha: 19:50 Dika okwu Jehova si di, ha nyere ya obodo ahu nke ọ riọrọ; ọbuná Timnat-sera n'ugwu Efraim: o we wue obodo, biri n'ime ya. 19:51 Ndia bu ihe-nketa, nke Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa nke Nun, na ndi-isi nke ndi bu nna nke ebo umu nke umu-ndikom nke ndi-isi Israel, ewe kè ya n'ihe-nketa nime Shailo n'iru Jehova, n'ife-nzà ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. Ya mere, ha mere ọgwụgwụ nke na-ekewa obodo.