Jona
2:1 Jona we si n'afọ azù ahu kpere Jehova, bú Chineke-ya;
ỌPUPU 2:2 Ọ si, N'ihi nweda-n'alam ka m'tikuworo Jehova, ya onwe-ya
nụ m; N'afọ ala-mọ ka m'siri tikue, I we nu olum.
2:3 N'ihi na I tubàram n'ebe miri emi, n'etiti oké osimiri; na nke
Imiri-miri nāb͕achim buruburu: Nri-miri-Gi nile na nbili-miri-Gi nile gabigara n'arum.
2:4 M'we si, Achupuwom n'iru Gi; ma M'gālekwasi kwa anya ọzọ
Ụlọ nsọ Gi.
2:5 Miri nāb͕am buruburu, rue nkpuru-obi: ob͕u-miri nēkpuchim
gbaa gburu-gburu, ata ata ahihia kechie n’isi m.
2:6 Adara m n'ala ugwu; uwa na nkpọrọ-ya nile di
bayerem rue mb͕e ebighi-ebi: ma I mewo ka ndum si na nbibi rigoputa, O
Jehova, bú Chinekem.
2:7 Mb͕e nkpuru-obim nāda #mbà nimem, M'we cheta Jehova: ekperem we bia
nime gi, ba n'ulo uku Gi di nsọ.
2:8 Ndị na-edebe ihe efu ụgha na-ahapụ onwe ha ebere.
2:9 Ma m ga-eji olu ekele chụọrọ gị àjà; M ga-
kwụọnụ nke ahụ m'kwe nkwa. Nzọputa sitere na Jehova.
2:10 Jehova we gwa azù ahu okwu, we b͕ọputa Jona n'akọrọ ahu
ala.