Aisaia
ABÙ ỌMA 63:1 Ònye bu nka nke nēsi Edom bia, ewere uwe etere ere si na Bọzra bia? nke a
Nke ahu di ebube n'uwe-ya, nēje ije n'idi-uku-ya
ike? Mu onwem nke nēkwu okwu n'ezi omume, dim ike izọputa.
63:2 N'ihi nka ka i nācha ọbara-ọbara n'uwe-gi, na uwe-gi nile di ka nke ahu
na-azọcha n'ime abụba mmanya?
63:3 Mu onwem zọchaworo ebe-nzọcha-nkpuru-vine, nání ya; ma n'etiti ndi Israel ọ dighi otù nime ha
n'ihi na M'gāzọkwasi ha n'iwem, we zọda ha n'imem
iwe; ma ọbara-ha ka agēwusa n'uwem, ma M'gāwusa
mebie uwe m nile.
63:4 N'ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di n'obim, na arọ nke ndi M'b͕aputaworo
bia.
63:5 M'we hu, ma ọ dighi onye nēyere aka; ma m tụrụ anya na ọ dị
ọ dighi onye nākwagide: n'ihi nka ogwe-akam wetaram nzọputa; na nke m
iwe, ọ kwadoro m.
63:6 M'gāzọda kwa ndim n'iwem, me ka ha ṅubiga manya ókè
iwem, M'gēme kwa ka ike-ha da n'ala.
ABÙ ỌMA 63:7 M'gēhota kwa ebere nile nke Jehova, na otuto nile nke Jehova
Jehova, dika ihe nile si di nke Jehova nyeworo ayi, na ihe uku
ezi ihe n'ebe ulo Israel di, nke O nyeworo ha
dika ebere-Ya si di, na dika iba-uba nke ya si di
ebere.
ABÙ ỌMA 63:8 N'ihi na ọ siri, N'ezie ndim ka ha bu, umu ndi nādighi-ekwu okwu-ugha: otú a
Ọ bu Onye-nzọputa-ha.
63:9 N'ime mkpagbu-ha nile, O wedara ya n'ala, na mọ-ozi nke iru-Ya
zọpụta ha: n'ihu-n'anya-Ya na n'ebere-Ya ka Ọ b͕aputara ha; ọ we b͕a ọtọ
ha we buru ha ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.
63:10 Ma ha nupuru isi, we kpasue Mọ Nsọ Ya: O we chigharia
bụrụ onye iro ha, o wee buso ha agha.
63:11 O we cheta ubọchi nile nke mb͕e ochie, Moses na ndi-Ya, si, Òle ebe?
Ọ bu onye nēme ka ha si n'oké osimiri rigoputa, Ya na onye-ọzùzù-aturu nke Ya
ìgwè atụrụ? òle ebe onye ahu nọ nke nētiye Mọ Nsọ nime ya?
63:12 Nke na-edu ha site n'aka nri nke Moses na ebube ogwe aka ya, na-ekewa
miri n'iru ha, ime onwe-ya aha ebighi-ebi?
63:13 Nke mere ka ha gafee ogbu mmiri, dị ka ịnyịnya n'ime ọzara, na ha
ekwesịghị ịsụ ngọngọ?
63:14 Dika anu-ọhia nārida na ndagwurugwu, Mọ nke Jehova mere ya
izu ike: otú a ka I duru ndi-Gi, ime Onwe-gi aha nsọpuru.
63:15 Si n'elu-igwe legide anya, si kwa n'ebe-obibi nke idi-nsọ-Gi le
na nke ebube-Gi: òle ebe ekworo-Gi na ike-Gi di, bú olu-gi
afọ-Gi na obi-ebere-Gi nile n'ebe m'nọ? ọ̀ ejidewo ha?
63:16 N'ezie, ị bụ nna anyị, ọ bụ ezie na Abraham amaghị anyị, na
Israel amataghi ayi: Gi onwe-gi, Jehova, bu nna-ayi, na onye-nb͕aputa-ayi;
Site na mb͕e ebighi-ebi ka aha-Gi bu.
ABÙ ỌMA 63:17 Jehova, n'ìhi gini ka I meworo ka ayi si n'uzọ-Gi kpafue, we me ka ayi di ike
obi site n'egwu-Gi? Lata n'ihi orù-Gi, bú ebo nile nke Gi
ihe nketa.
ABÙ ỌMA 63:18 Ndi nke idi-nsọ-Gi enwetawo ya nání mb͕e ntà: ayi
ndi-nkpab͕u azọdawo ebe nsọ Gi.
ABÙ ỌMA 63:19 Ayi bu nke Gi: Ọ dighi mb͕e I nāchi ha; a kpọghị ha
aha gi.