Jenesis 46:1 Israel we bulie ije, ya na ihe nile o nwere, biarue Bia-sheba; o we chuara Chineke nke nna-ya Aisak àjà. 46:2 Chineke we gwa Israel okwu n'ọhù nile nke abali, si, Jekob; Jekọb. Ọ si, Lekwam. ỌNU-ỌGUGU 46:3 Ọ si, Mu onwem bu Chineke, bú Chineke nke nna-gi: atula egwu irida nime Ijipt; n'ihi na n'ebe ahu ka M'gēme gi ka i ghọ mba uku; 46:4 M'gēso gi rida n'Ijipt; ọzọ kwa, M'gēme ka i bia n'ezie ọzọ: Josef gātukwasi kwa aka-ya n'anya-gi abua. 46:5 Jekob we si na Bia-sheba bilie: umu Israel we buru Jekob nna-ha, na umu-ntakiri-ha, na nwunye-ha, n'ub͕ọ-ala nke Fero zigara ibu ya. 46:6 Ha we chiri anu-ulo-ha, na àkù-ha, nke ha batara ala Kenean we bata n'Ijipt, Jekob na nkpuru-ya nile ya: 46:7 Umu-ya ndikom, na umu-ndikom umu-ya ndikom tiyere ya, na umu-ya ndinyom, na umu-ya ndikom. umu-ndinyom, o we me ka nkpuru-ya nile bia n'Ijipt. 46:8 Ma ndị a bụ aha ụmụ Izrel, ndị batara Ijipt, Jekọb na ụmụ ya: Ruben, ọkpara Jekọb. 46:9 Na umu-ndikom Reuben; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami. 46:10 na umu-ndikom Simeon; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoha, na Shaul nwa-nwoke nke nwanyi Kenean. 46:11 na umu-ndikom Livai; Geshọn, na Kohat, na Merari. 46:12 na umu-ndikom Juda; Ia, na Onan, na Shela, na Perez, na Zera; ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean. Umu-ndikom Perez bu kwa Hezrọn na Hamul. 46:13 na umu-ndikom Isaka; Tola, na Puva, na Job, na Shimron. 46:14 na umu-ndikom Zebulun; Sered, na Elon, na Jahleel. ỌNU-ỌGUGU 46:15 Ndia bu umu-ndikom Lia, nke ọ muru nye Jekob na Padan-eram, bú umu-ndikom Lia. nwa-ya nwayi Daina: nkpuru-obi nile nke umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom di iri atọ na atọ. 46:16 na umu-ndikom Gad; Zifion, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Eri, na Arodi, na Areli. 46:17 na umu-ndikom Asha; Jimna, na Ishua, na Isui, na Beria, na Sera nwa-nne-ha nwayi: na umu-ndikom Beria; Heba, na Malkiel. 46:18 Ndia bu umu-ndikom Zilpa, onye Leban nyere Lia nwa-ya nwayi, na ndia ka ọ mu-kwa-ra Jekob, bú nkpuru-obi iri na isi. 46:19 Umu-ndikom Rechel nwunye Jekob; Josef, na Benjamin. 46:20 Ma nye Josef n'ala Ijipt ka amuru Manase na Efraim; nke Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera, bú onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya. 46:21 Umu-ndikom Benjamin kwa; Bela, na Beka, na Ashbel, na Gera, na Neaman, Ehi, na Rosh, Muppim, na Hupim, na Ard. 46:22 Ndia bu umu-ndikom Rechel, ndi amuru nye Jekob: nkpuru-obi nile dị iri na anọ. 46:23 na umu-ndikom Dan; Hushim. 46:24 Na umu-ndikom Naftali; Jahziel, na Guni, na Jeza, na Shilem. 46:25 Ndia bu umu-ndikom Bilha, nke Leban nyere Rechel nwa-ya nwayi; ọ we muara Jekob ihe ndia: nkpuru-obi nile di asa. 46:26 Nkpuru-obi nile ndi soro Jekob bata n'Ijipt, ndi siri na ya puta úkwù, nāgughi nwunye nile nke umu Jekob, nkpuru-obi nile di ọgu atọ na iri isii; 46:27 Ma umu-ndikom Josef, ndi amuru ya n'Ijipt, di nkpuru-obi abua. nkpuru-obi nile nke ulo Jekob, ndi batara n'Ijipt, di iri atọ na iri. 46:28 O we ziga Juda n'iru ya jekuru Josef, ka o guzo iru-ya iru Goshen; ha we ba n'ala Goshen. 46:29 Josef we dozie ub͕ọ-ala-ya, rigo izute Israel nke ya nna, Goshen, me onwe-ya ka ọ hu ya; o we dakwasi ya olu, we kwa ákwá n'olu-ya ogologo oge. 46:30 Israel we si Josef, Biko, ka m'nwua, n'ihi na ahuwom iru-gi; n'ihi na i di ndu. 46:31 Josef we si umu-nne-ya, si kwa ulo nna-ya, M'gāchọ rigo, gosi Fero, si ya, Umu-nnem, na nke nnam ulo, nke di n'ala Kenean, biakutem; 46:32 Ma ndikom ahu bu ndi-ọzùzù-aturu, n'ihi na ọlu-ha bu izù anu-ulo; na ha emewo ka ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha na ihe nile ha nwere bia. 46:33 Ọ gēru kwa, mb͕e Fero gākpọ unu, si, Kedu ọrụ gị? 46:34 na unu gāsi, ahia ndi-orù-gi bu anu-ulo nke ayi n'okorobia rue ub͕u a, ma ayi onwe-ayi, ma kwa nna-ayi-hà: ka unu we biri n'ala Goshen; n'ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye-ọzùzù-aturu bu Ndị Ijipt.