Jenesis
35:1 Chineke we si Jekob, Bilie, rigorue Bet-el, biri n'ebe ahu: ma
Mere Chineke ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, Nke emere ka i hu Ya anya mb͕e i nāb͕alaga
site n'iru Isọ nwa-nne-gi.
35:2 Jekob we si ulo-ya, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Put
wezuganu chi ala ọzọ nile nke di n'etiti unu, di-kwa-nu ọcha, b͕anwe kwa unu
uwe:
35:3 Ka ayi bilie, rigorue Bet-el; M'gēme kwa ebe-ichu-àjà n'ebe ahu
diri Chineke, bú Onye zam n'ubọchi nkpàm, Ọ nọyerem n'ime
ụzọ nke m jere.
35:4 Ha we nye Jekob chi ala ọzọ nile nke di n'aka-ha;
na nb͕a-aka-ha nile nke di na nti-ha; Jekob we zobe ha
n'okpuru osisi oak nke di n'akuku Shekem.
35:5 Ha we bulie ije: oké egwu nke Chineke we dikwasi obodo nile nke di
ha buruburu, ma ha achughi umu-ndikom Jekob n'azu.
35:6 Jekob we biarue Luz, nke di n'ala Kenean, bú Bet-el;
ya na ndị niile ya na ha nọ.
35:7 O wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọ ebe ahu El-bet-el: n'ihi na
n'ebe ahu ka Chineke mere ka ọ hu Ya anya, mb͕e ọ nāb͕apu n'iru nwa-nne-ya.
35:8 Ma Debora, bú nwayi nēnye Ribeka, nwuru, elìe ya n'okpuru Bet-el
n'okpuru osisi oak: ewe kpọ aha-ya Alọn-bachut.
35:9 Chineke we me ka Jekob hu Ya anya ọzọ, mb͕e o siri na Padan-eram puta
gọziri ya.
35:10 Chineke we si ya, Jekob ka aha-gi bu: agaghi-akpọ aha-gi
Jekob ọzọ, ma Israel gābu aha-gi: o we kpọ aha-ya
Israel.
35:11 Chineke we si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile: mua ọmùmù, ba kwa uba; a
mba na nkpọkọta mba nile gēsi na gi puta, ndi-eze gābia kwa
site n'úkwù-gi;
35:12 Ma ala nke M'nyere Abraham na Aịzik, gị ka M ga-enye ya, na
Nkpuru-gi nke gānọchi gi ka M'gēnye ala ahu.
35:13 Chineke we si n'ebe ọ nọ rigo n'ebe Ọ kpayere ya uka.
35:14 Jekob we guzo ogidi n'ebe ahu ọ kpayere ya uka, bú a
ogidi nkume: ọ wukwasi àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya, wukwasi
mmanụ n'elu ya.
35:15 Jekob we kpọ aha ebe ahu ebe Chineke kpayere ya uka, Bet-el.
35:16 Ha si na Betel bulie ije; ma e nwere nanị ụzọ nta ka ọ ga-esi bịa
rue Efrat: ime Rechel we di kwa nwa-ya;
35:17 O rue, mb͕e ọ di n'aru, na nwayi nēle ime kwuru
si ya, Atula egwu; nwa-nwoke a ka i gēnwe kwa.
35:18 O rue, mb͕e nkpuru-obi-ya nāpu, (n'ihi na ọ nwuru) na
ọ we kpọ aha-ya Benoni: ma nna-ya kpọrọ ya Benjamin.
35:19 Rechel we nwua, elìe ya n'uzọ Efrat, nke ahu bu
Betlehem.
35:20 Jekob we guzo ogidi n'elu ílì-ya: nke ahu bu ogidi nke Rechel
ili rue ta.
35:21 Israel we bulie ije, b͕asa ulo-ikwū-ya n'ofè ulo-elu Ida.
35:22 O rue, mb͕e Israel biri n'ala ahu, na Reuben jere
ha na Bilha, bú iko nna-ya, we dina: Israel we nu ya. Ugbu a
umu-ndikom Jekob di iri na abua:
35:23 Ụmụ Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na
Juda, na Isaka, na Zebulun:
35:24 Umu-ndikom Rechel; Josef na Benjamin:
35:25 na umu-ndikom Bilha, bú orù-nwayi Rechel; Dan na Naftali:
35:26 na umu-ndikom Zilpa, bú orù-nwayi Lia; Gad na Asha: ndia bu ndia
umu-ndikom Jekob, ndi amuru nye ya na Padan-eram.
35:27 Jekob we biakute Aisak, bú nna-ya, rue Mamre, n'obodo Arba;
nke ahu bu Hebron, ebe Abraham na Aisak biri dika ọbìa.
35:28 Ma ụbọchị Aịzik wee bụrụ otu narị afọ na iri asatọ.
35:29 Aisak we kubie ume, nwua, ewe chikọta ya na umu-nna-ya.
ọ bu agadi, ju kwa ubọchi ndu: umu-ya ndikom Isọ na Jekob we lìe ya.