Jenesis
22:1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Chineke nwara Abraham, na
we si ya, Abraham: ọ si, Le, le.
ỌNU-ỌGUGU 22:2 Ọ si, Biko, kuru nwa-gi nwoke, bú nwa-nwoke i nwere, Aisak, onye i huru n'anya.
ma banye n’ala nke Moraịa; churu ya àjà n'ebe ahu ka ọ buru ọku
àjà n'elu otu n'ime ugwu nke m ga-agwa gị.
22:3 Abraham we bilie n'isi-ututu, jikwa inyinya-ibu-ya, were
umu-okorọbia-ya abua tiyere ya, na Aisak nwa-ya, wara nkú-ya
àjà-nsure-ọku, we bilie, je n'ebe ahu nke Chineke
gwara ya.
22:4 N'ubọchi nke-atọ Abraham weliri anya-ya abua, hu ebe ahu n'ebe di anya
gbanyụọ.
22:5 Abraham we si umu-okorọbia-ya, Nọdunu n'ebe a, unu na inyinya-ibu; na m
nwa-okoro ahu gāga kwa n'ebe ahu, kpọ isi ala, biaghachikute kwa gi ọzọ.
22:6 Abraham we were nku nke àjà-nsure-ọku, tukwasi ya Aisak
nwa ya nwoke; o were ọku n'aka-ya, na mma; ha we je
ha abụọ ọnụ.
22:7 Aisak we gwa Abraham nna-ya okwu, si, Nnam;
si, Lekwam, nwam. Ọ si, Le, ọku na nkú: ma
òle ebe nwa-aturu nke àjà-nsure-ọku di?
ỌNU-ỌGUGU 22:8 Abraham we si, Nwam, Chineke gēdobere Onwe-ya nwa-aturu nke nēsure ọku
àjà: ha abua we jekọ n'otù.
22:9 Ha we biarue ebe ahu nke Chineke gwara ya; Abraham we wue
ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, do nkú n'usoro, ke Aisak nwa-ya, ab͕u, na
tukwasi ya n'elu ebe-ichu-àjà n'elu nkú.
22:10 Abraham we setipu aka-ya, were mma ahu ka ọ nwua
nwa nwoke.
22:11 Mọ-ozi nke Jehova we si n'elu-igwe kpọ ya òkù, si,
Abraham, Abraham: ọ si, Lekwam.
ỌPUPU 22:12 Ọ si, Etukwasila aka-gi n'aru nwa-okoro ahu, eme-kwa-la ihe ọ bula
n'ihi na ub͕u a amawom na i nātu egwu Chineke, n'ihi na i dighi-atu egwu
b͕ochie nwa-gi nwoke, bú nwa-nwoke i nwere náním.
22:13 Abraham we welie anya-ya abua, hu, ma, le, otù ebulu n'azu ya
n'olùlù ahu jidesiri mpi-ya: Abraham we je were ebulu ahu, were
sure ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku n'ọnọdu nwa-ya nwoke.
22:14 Abraham we kpọ aha ebe ahu Jehova-jire: dika anāsi
ta, N'ugwu Jehova ka agāhu ya.
22:15 Mọ-ozi nke Jehova we si n'elu-igwe kpọ Abraham nke-abua
oge,
ỌNU-ỌGUGU 22:16 Ọ si, Ọ bu Onwem ka M'jiworo ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na i ṅuwom iyi.
mee ihe a, ma i b͕ochighi nwa-gi nwoke, bú nwa-nwoke i nwere nání ya.
22:17 Na na ngọzi m ga-agọzi gị, na n'ịba ụba m ga-aba ụba
Nkpuru-gi dika kpakpando nke elu-igwe, na dika ájá nke di n'elu uwa
oke osimiri; ma nkpuru-gi gēnweta ọnu-uzọ-ama ndi-iro-ya;
22:18 Na na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba nile nke ụwa; n'ihi na
I gewo nti olum.
22:19 Abraham we laghachikuru umu-okorọbia-ya, ha we bilie je
ọnu-ọgugu b͕a-kwa-ra Bia-sheba; Abraham we biri na Bia-sheba.
22:20 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na agwara Abraham.
si, Le, Milka, ya onwe-ya amu-kwa-ra nwa-nne-gi umu-ndikom
Nehọ;
22:21 Huz, bú ọkpara-ya, na Buz nwa-nne-ya, na Kemuel nna Siria;
22:22 na Kesed, na Hazo, na Pildash, na Jidlaf, na Betuel.
22:23 Betuel we mua Rebeka: asatọ ndia Milka muru Nehoa.
Umu-ndikom Abraham.
22:24 Ma iko-ya nwayi, onye aha-ya bu Reuma, ọ mu-kwa-ra Teba;
Gaham, na Tahash, na Meaka.