Jenesis
20:1 Abraham we si n'ebe ahu bulie ije ga n'ala Ndida, biri
n'etiti Kedesh na Shua, we nọ dika ọbìa na Gera.
20:2 Abraham we kwue okwu bayere Sera, bú nwunye-ya, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu: na Abimelek, bú eze
nke Gera we ziga, kuru Sera.
20:3 Ma Chineke biakutere Abimelek na nrọ n'abali, si ya, Le,
nwoke nwuru anwu ka i bu, n'ihi nwayi ahu nke i kuruworo; n'ihi na ọ bu ya
nwunye nwoke.
20:4 Ma Abimelek abiarughi ya nso: ọ si, Jehova, I gēb͕u
ọbuná mba ezi omume?
20:5 Ọ sighm, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? ma ya onwe-ya we si,
Ọ bu nwa-nnem nwoke: N'izu-okè nke obim, na n'izu-okè nke akam abua
emela m ihe a.
20:6 Chineke we si ya na nrọ, E, amawom na i mere nka na
iguzosi ike n'ezi ihe nke obi-gi; n'ihi na M'we b͕ochie gi ka i ghara imehie
imegidem: n'ihi nka ekweghm ka i metu ya aka.
20:7 Ma ub͕u a nyeghachi nwoke ahu nwunye-ya; n'ihi na onye-amuma ka ọ bu, ya onwe-ya
ga-ekpe ekpere bayere gi, i we di ndu: ma ọ buru na i meghachighi ya;
mara na i ghaghi inwu, gi onwe-gi na ihe nile nke gi.
20:8 Abimelek we bilie n'isi-ututu, kpọ ndi-ya nile
ndi-orù, we gosi ihe ndia nile na nti-ha: ma ndikom ahu nēbisi ike
egwu.
20:9 Abimelek we kpọ Abraham, si ya, Gini ka i meworo
nye anyi? ma gini ka m'meworo megide gi, na i meworo ka ọ biakwasim na
ọ̀ bu nmehie uku n'ala-ezem? I mewom omume nke nēkwesighi
a ga-eme.
20:10 Abimelek we si Abraham, Gini ka i huru, na i meworo
ihe a?
ỌNU-ỌGUGU 20:11 Abraham we si, N'ihi na m'siri, N'ezie egwu Chineke adighi nime ya
ebe a; + ha ga-egbukwa m n’ihi nwunye m.
20:12 Ma n'ezie ọ bụ nwanne m nwaanyị; ọ bụ ada nna m, ma
ọ bughi ada nnem; o we ghọrọm nwunye.
20:13 O rue, mb͕e Chineke merem ka m'si n'aka nnam kpafue
ulo, na m'siri ya, Nka bu ebere-gi nke i gēmere
nyem; n'ebe ọ bula ayi gābia, unu gāsim, Ọ bu nkem
nwanne.
20:14 Abimelek we chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na orù ndikom, na ndinyom nēje ozi;
o were ha nye Abraham, nyeghachi ya Sera, bú nwunye-ya.
20:15 Abimelek we si, Le, alam di n'iru gi: biri n'ebe ya
na-amasị gị.
ỌPUPU 20:16 Ọ si Sera, Le, enyewom nwa-nne-gi nnù abua na ọgu iri
iberibe ọla-ọcha: le, ọ bu gi ihe-nkpuchi anya, nye madu nile
ndi nọyere gi, ya na ndi nile ọzọ: ewe tu ya nba.
20:17 Abraham we kpere Chineke: Chineke we me ka aru di Abimelek na nwunye-ya ike
ndi-orù-ya; ha we mua umu.
ỌPUPU 20:18 N'ihi na Jehova mechiri àkpà-nwa nile nke ulo Abimelek;
n'ihi Sera nwunye Abraham.