Jenesis
13:1 Abram we si n'Ijipt rigo, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na ihe nile o nwere;
na Lot tiyere ya, rue Ndida.
13:2 Ma Abram bara ọgaranya nke ukwuu na anu-ulo, na ọla-ọcha, na n'ọlaedo.
ỌNU-ỌGUGU 13:3 O we si n'akuku Ndida je ije rue Bet-el, rue ulo
ebe ulo-ikwū-ya diri na nmalite, n'etiti Bet-el na Ai;
13:4 rue ọnọdu nke ebe-ichu-àjà, nke o mere n'ebe ahu na mbu: na
Abram we kpọkue aha Jehova n'ebe ahu.
13:5 Ọzọ kwa, Lọt, onye ya na Abram jere, nwere ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na ulo-ikwū.
13:6 Ma ala ahụ enweghị ike iburu ha, ka ha wee biri n'otu.
n'ihi na àkù-ha bara uba, ha apughi kwa ibikọ n'otù.
13:7 Ma ise-okwu we di n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo Abram na ndi-ọzùzù
ndi-ọzùzù anu-ulo Lot: ndi Kenean na ndi-Perizait we biri
emesia n'ala.
13:8 Abram we si Lot, Biko, ka ise-okwu ghara idi n'etitim
na gi onwe-gi, na n'etiti ndi-ọzùzù-aturum na ndi-ọzùzù anu-ulo-gi; n'ihi na ayi bu umu-nne.
13:9 Ọ̀ bughi ala ahu nile n'iru gi? biko, kewapu onwe-gi
mu: ọ buru na i were aka-ekpe, m'gāga kwa n'aka-nri; ma ọ bụ ọ bụrụ
i gāla n'aka-nri, M'gāga kwa n'aka-ekpe.
13:10 Lot we welie anya-ya abua, hu buruburu-ala nile nke Jọdan, na ọ bu
miri nke ọma n'ebe nile, tutu Jehova ebibie Sọdọm na
Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, dika
i nābiarute Zoa.
13:11 Lot we rọputara ya Buruburu-ala nile nke Jọdan; Lot we bulie ije n'ọwuwa-anyanwu: ma
ha kewapụrụ onwe ha, otu na ibe ya.
13:12 Abram biri n'ala Kenean, na Lot biri n'obodo nile nke
Araba ahu, ma ulo-ikwū-ya n'ebe Sọdọm di.
13:13 Ma ndị Sọdọm bụ ndị ajọ omume na ndị mmehie n'ihu Jehova
nke ukwuu.
13:14 Jehova we si Abram, mb͕e Lot kewapuru n'ebe ọ nọ;
Biko, welie anya-gi elu, si n'ebe i nọ legide
akuku Ugwu, na akuku Ndida, na akuku Iru-anyanwu, na akuku Ọdida-anyanwu;
13:15 N'ihi na ala nile nke i nāhu, gi ka M'gēnye ya, nye kwa gi
mkpụrụ ruo mgbe ebighị ebi.
13:16 M'gēme kwa nkpuru-gi ka ọ di ka ájá nke ala;
gukọta ájá nke ala, mb͕e ahu ka agāgu kwa nkpuru-gi.
13:17 Bilie, jegharịa n'ala n'ogologo ya na n'obosara nke
ọ; n'ihi na m'gēnye gi ya.
13:18 Abram we wezugara ulo-ikwū-ya, bia biri n'ala ihe nādighi nke Mamre.
nke di na Hebron, wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu.