Jenesis
6:1 Ma o wee ruo na, mgbe ndị mmadụ malitere ịba ụba n'ihu nke
uwa, na umu-ndinyom ka amuru nye ha;
6:2 Na umu-ndikom Chineke huru umu-ndinyom nke madu na ha mara nma; na
ha we lutara onwe-ha ndinyom nile nke ha rọputara.
6:3 Jehova we si, Mọm agaghi-adigide n'aru madu mb͕e nile, n'ihi nka
ya onwe-ya bu kwa anu-aru: ma ubọchi-ya gābu ọgu arọ isi na iri.
6:4 E nwere ndị Refeyim n'ụwa n'oge ahụ; na kwa mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe
umu-ndikom nke Chineke biakutere umu-ndinyom nke madu, ha we mua
umu-ntakiri nye ha, ndi ahu ghọrọ ndi-dike nke bu ndi-dike mb͕e ochie, ndikom nke oge ochie
ama ama.
6:5 Chineke we hu na ajọ omume nke madu riri nne n'uwa, na
ọchichọ ọ bula nke èchìchè nile nke obi-ya bu nání ihe ọjọ
mgbe niile.
6:6 Ma Jehova chegharịrị na O mere mmadụ n'ụwa, na ya
o wutere ya n’obi ya.
6:7 Jehova we si, M'gēkpochapu madu nke M'keworo n'iru
nke ụwa; ma madu, ma anumanu, na ihe nākpu akpu, na anu-ufe
nke ikuku; n’ihi na ọ chegharịrị na m mere ha.
6:8 Ma Noa hụrụ amara n'anya Jehova.
6:9 Ndia bu osuso-ọmumu Noa: Noa bu onye ezi omume, zu kwa okè nime ya
ọb͕ọ-ya nile, Noa we so Chineke jegharia.
6:10 Noa we mua umu-ndikom atọ, Shem, Ham, na Jefet.
6:11 Na ụwa e mebiri emebi n'ihu Chineke, na ụwa jupụtara
ime ihe ike.
6:12 Chineke we lekwasi uwa, ma, le, o mebiri; maka mmadụ niile
anụ arụ emebiwo ụzọ ya n'elu ụwa.
6:13 Chineke we si Noa, Ọgwugwu anu-aru nile abiawo n'irum; maka
uwa juputara n'ihe-ike site na ha; ma, le, M'gaje ibibi
ha na ụwa.
6:14 Mere onwe-gi ub͕ọ nke osisi gofa; ime-ulo ka i gēme n'ub͕ọ ahu, na
ọ bu n'ime na n'èzí ka i gēwere ọlu-miri tukwasi ya.
6:15 Ma nke a bụ ihe oyiyi nke ị ga-eme ya: ogologo nke
ub͕ọ gādi nnù cubit atọ, obosara-ya gādi kwa ọgu cubit abua na iri, na
orú cubit na iri ka idi-elu-ya di.
6:16 Window ka i gēme ka ub͕ọ ahu di, ọ bu kwa cubit ka i gēmezu ya
n'elu; ọnu-uzọ nke ib͕e ahu ka i gētiye kwa n'akuku-ya; ya na
Ulo ala di ala, na nke-abua, na nke-atọ, ka i gēme ya.
6:17 Ma, le, Mu onwem, ọbuná Mu onwem, nēme ka iju-miri bia n'elu uwa
kpochapuru anu-aru nile, nke ume nke ndu di nime ya, site n'okpuru elu-igwe; na
ihe ọ bula nke di n'uwa gānwu.
6:18 Ma n'ebe i nọ ka M'gēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike; i gābata kwa
ib͕e, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye-gi, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere gi.
6:19 Na n'ime ihe ọ bụla dị ndụ nke anụ ahụ nile, abụọ n'ụdị ọ bụla ị ga-
bata n'ub͕ọ ahu, idebe ha na gi ndu; ha gābu nwoke na
nwanyi.
6:20 Nke anụ ufe dị iche iche, na anụ ụlọ dị iche iche, nke ọ bụla
ihe na-akpụ akpụ nke ụwa n'ụdị ya, abụọ n'ụdị ọ bụla ga-abịa
nye gi, ime ka ha di ndu.
6:21 Ma gi onwe-gi ufọdu nime nri nile nke anēri, na i gāchikọta
ya nye gi; ọ gābu-kwa-ra gi na ha ihe-oriri.
6:22 Otú a ka Noa mere; dika ihe nile nke Chineke nyere ya n'iwu si di, otú a ka o mere.