Ezikiel
35:1 Okwu Jehova we ruem nti, si,
ABÙ ỌMA 35:2 Nwa nke madu, che iru-gi megide ugwu Sia, bue amuma megide ya.
35:3 si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri; Le, ugwu Sia, Mu onwem bu
imegide gi, M'gāseti kwa akam imegide gi, m'gāhu kwa
mee ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.
35:4 M'gēme kwa ka obodo-gi nile tọb͕ọrọ n'efu, i gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, i gā
maranu na Mu onwem bu Jehova.
35:5 N'ihi na i nwewo ikpọ-asì ebighi-ebi, i we wusi ọbara Jehova
umu Israel site n'ike mma-agha na mb͕e ha
ihe ọjọ, na mb͕e ajọ omume-ha gwusiri;
35:6 Ya mere, dị nnọọ ka m dị ndụ, ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru, M ga-akwado gị
ọbara, ọbara gāchu kwa gi: sit i kpọghi ọbara asì, ọbuná
ọbara gāchu gi.
35:7 Otú a ka M'gēme ugwu Sia ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, M'gēbipu kwa nime ya onye ahu
nāgabiga na onye nālaghachi.
35:8 M'gēmeju kwa ugwu-ya nile na ndi-ya eb͕uru eb͕u: n'ugwu ntà gi na nime
Ndagwurugwu-Gi nile na n'osimiri-Gi nile ka ndi ejiworo b͕u gāda
mma agha.
35:9 M'gēme gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu rue mb͕e ebighi-ebi, obodo-gi nile agaghi-alọta kwa.
unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
35:10 N'ihi na i asiwo, Mba abua ndia na ala abua ndia gādi
bụrụ nke m, ma anyị ga-enweta ya; ma Jehova nọ n'ebe ahu:
35:11 Ya mere, dị nnọọ ka m dị ndụ, ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru, m ga-emekwa dị ka
iwe-Gi, na dika ekworo-Gi si di nke I meworo site na Gi
ịkpọasị megide ha; M'gēme kwa ka amara onwem n'etiti ha, mb͕e m'nēme
ekpewo gi ikpe.
35:12 I gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, na anuwokwam ihe-gi nile
nkwulu nke I kwuworo megide ugwu nile nke Israel;
si, Ha emewo ka ha tọb͕ọrọ n'efu, enyewo ayi ka ayi gwusia.
35:13 Otú a ka unu ji ọnụ-unu turu isi megidem, we ba uba
okwu-unu megidem: anuwom ha.
35:14 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri; + Mgbe ụwa dum na-aṅụrị ọṅụ, m ga-eme ya
gi tọb͕ọrọ n'efu.
35:15 Dị ka ị na-aṅụrị ọṅụ n'ihe nketa nke ụlọ Izrel, n'ihi na
ebe tọb͕ọrọ n'efu ka ọ bu, otú a ka M'gēme gi: ebe tọb͕ọrọ n'efu ka i gābu, ugwu
Sia, na Idumea nile, bú ya nile: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova
Jehova.