Ezikiel 30:1 Okwu Jehova we ruem nti, si, 30:2 Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri; Kwasienụ ákwá, ahụhụ kwesịrị ụbọchị! 30:3 N'ihi na ubọchi di nso, ọbuná ubọchi Jehova di nso; ya gābu oge nke mba nile. 30:4 Na mma agha ga-abịakwasị Ijipt, na oké ihe mgbu ga-adị Etiopia, mb͕e ndi eb͕uru eb͕u gāda n'Ijipt, ha gēwepu kwa ọtutu-ya, agākwatu kwa ntọ-ala-ya nile. 30:5 Etiopia, na Libia, na Lidia, na ndi nile agwakọtara, na Kub; ma ndikom ala ahu nke b͕ara ndu gēso ha da n'akuku Jehova mma agha. 30:6 Otú a ka Jehova siri; Ndi nākwado Ijipt gāda kwa; na nke npako nke ike-ya gēsi kwa n'ulo-elu nke Siene ridata were mma-agha da nime ya, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 30:7 Ha ga-abụkwa ebe tọgbọrọ n'efu n'etiti ala ndị dị ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-ya nile gādi kwa n'etiti obodo nile nke di emefusịa. 30:8 Ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tiyeworo ọku n'Ijipt; mb͕e agēme kwa ka ndi-iye-aka-ya nile la n'iyì. 30:9 N'ụbọchị ahụ, ndị ozi ga-esi n'ebe m nọ pụọ n'ụgbọ mmiri ime Ndị Etiopia na-enweghị uche ga-atụ egwu, ihe mgbu dị ukwuu ga-abịakwasịkwa ha, dị ka n'ime ya ubọchi Ijipt: n'ihi na, le, ọ nābia. 30:10 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri; M'gēme kwa ka ìgwè madu nile nke Ijipt bia kwusi n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon. 30:11 Ya na ndị ya na ya, ndị dị egwu nke mba dị iche iche, ga-abụ ewetara ibibi ala: ha gāmipu kwa mma-agha-ha imegide ha Ijipt, meju kwa ala ahu na ndi eb͕uru eb͕u. 30:12 M'gēme kwa ka osimiri nile takọrọ, re kwa ala ahu n'aka Jehova ajọ omume: M'gēme kwa ka ala nka na ihe nile di nime ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu site n'aka Jehova aka ndi ala ọzọ: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo ya. 30:13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri; M'gēme kwa ka arusi nile la n'iyì, me ka ha mebie arusi-ha nile gākwusi na Nof; onye-isi agaghi-adi kwa ọzọ nke ala Ijipt: M'gētiye kwa ujọ n'ala Ijipt. 30:14 M'gēme kwa Patros ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, M'gātuye kwa ọku nime Zoan, we me kpee ikpe na No. 30:15 M'gāwukwasi kwa ọnumam n'aru Sin, bú ebe siri ike nke Ijipt; na m ga-ebipụ pụọ n'ìgwè nke No. 30:16 M ga-esunye ọkụ n'Ijipt: Sin ga-enwe oké ihe mgbu, na No ga-adị gbawasịa, ma Nọf ga-enwe mkpagbu kwa ụbọchị. 30:17 Umu-okorọbia nke Aven na nke Pibeset gāda site na mma-agha: ma ndia obodo nile gāla n'agha. 30:18 Na Tehafnehes ubọchi gāb͕a ọchichiri, mb͕e M'gāb͕awa n'ebe ahu yoke nile nke Ijipt: nbili-elu nke ike-ya gākwusi kwa nime ya: dika n'ihi na ya, igwe-oji gēkpuchi ya, umu-ya ndinyom gābà kwa ndọkpụ n'agha. 30:19 M'gēme kwa ihe ekpere n'ikpe n'Ijipt: ha ewe mara na Mu onwem bu Chineke. 30:20 O rue, n'arọ nke-iri-na-otù, n'ọnwa mbu, na n'ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, sị, 30:21 Nwa nke madu, ab͕ajiwom ogwe-aka Fero, bú eze Ijipt; ma, le, ya agaghi-ekechi ya ka ewe me ya ka ọ di ike, itiye nkpa-n'aka itiye ya, ime o siri ike ijide mma agha. 30:22 Ya mere, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri; Le, Mu nēmegide Fero eze Ijipt, ọ gāb͕aji kwa ogwe-aka-ya abua, bú nke di ike, na nke etijiri ab͕aji; M'gēme kwa ka mma-agha da n'aka-ya. 30:23 M ga-achụsasịkwa ndị Ijipt n'etiti mba dị iche iche, na ga-agbasasị ha site na mba. 30:24 M ga-emekwa ka ogwe aka nke eze Babịlọn dị ike, na m ga-etinye mma agha m n'aka-ya: ma M'gāb͕ajipu ogwe-aka Fero, ọ gāsu kwa ude n'iru ya na isu-ude nke onye emeruworo ọnwu. 30:25 Ma m ga-eme ka ogwe aka nke eze Babịlọn dị ike, na ogwe aka nke Fero gāda kwa ala; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova, mb͕e Mu onwem m'gētiye kwa mma-agham n'aka eze Babilon, ọ gētiye kwa gbatịa ya n’ala Ijipt. 30:26 M ga-achụsasịkwa ndị Ijipt n'etiti mba dị iche iche, na-achụsasịkwa ha n'etiti mba; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.