Ezikiel 19:1 Ọzọ kwa, bulienu ndi-isi Israel abù-ákwá; 19:2 Ma si, Gini bu nne-gi? Ọdum: ọ nāmakpu n'etiti ọdum, ya onwe-ya wetara umu-ya n'etiti umu-ọdum. 19:3 O we zulite otù nime umu-ya: ọ ghọ nwa-ọdum, o we me ya mụtara ịnwụde anụ; o nēripia madu. 19:4 Mba nile we nu ya; ewe kuru ya n'olùlù-ha, ha onwe-ha chiri iyab͕u wetara ya n'ala Ijipt. 19:5 Ma mb͕e ọ huru na ọ nēchere, na olile-anya-ya furu efu, o we hu chiri ọzọ nime umu-ya, me ya nwa-ọdum. 19:6 O wee na-arịgo n'etiti ọdụm, ọ ghọrọ nwa ọdụm, na muta idọb͕u, we rie madu. 19:7 O we mara ulo-elu nile ha tọb͕ọrọ n'efu, O we me ka obodo nile ha tọb͕ọrọ n'efu; na ala ahu tọb͕ọrọ n'efu, na ùjú-ya, site n'olu-ya na-ebigbọ ebigbọ. 19:8 Mba nile we guzo megide ya n'akuku nile site n'ala nile, na b͕asa ub͕u-ha n'elu Ya: ewe jide ya n'olùlù-ha. 19:9 Ha we tiye ya n'ulo-nkpọrọ n'agbụ ígwè, me ka ọ biakute eze Babịlọn: ha mere ka ọ ba n'ebe ewusiri ike, ka olu-ya we ghara idi ọzọ nuru n'elu ugwu nile nke Israel. 19:10 Nne-gi di ka osisi vine n'ọbara-gi, nke akuworo n'akuku miri: ọ di nāmi nkpuru, ju kwa alaka n'ihi ọtutu miri. ỌPUPU 19:11 O we nwe nkpa-n'aka di ike ibu nkpa-n'aka nke ndi nāchi achi, ya na ya. E di elu n'etiti alaka osisi siri ike, o we puta ìhè nime ya idi-elu ya na iba-uba nke alaka-ya. 19:12 Ma a dọpụrụ ya n'ọnụma, a tụdara ya n'ala, na Ifufe Iru-anyanwu mere ka nkpuru-ya tasia: ab͕ajiwo nkpa-n'aka-ya nile, kpọnwua; ọkụ ripịara ha. 19:13 Ma ugbu a, a kụrụ ya n'ala ịkpa, na ala kpọrọ nkụ na nke akpịrị ịkpọ nkụ. 19:14 Ma ọku esiwo n'osisi nke alaka-ya, nke ripiaworo ya mkpuru, nke mere na o nweghi nkpa-n'aka siri ike ibu nkpa-n'aka eze. Nke a bụ a ikwa-ákwá, ọ gābu kwa ikwa-ákwá.