Ezikiel 4:1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were onwe-gi a tile, tukwasi ya n'iru gi, na wukwasi ya obodo ahu, bú Jerusalem; 4:2 Ma nọchibidoro ya, wuo ebe siri ike megide ya, wuo ugwu megide ya; guzo kwa ọmuma-ulo-ikwū imegide ya, guzo kwa ihe-ọmuma megide ya ya gburugburu. 4:3 Ọzọ, chiri n'onwe-gi ite ígwè, guzo ya ka ọ buru mb͕idi ígwè n'etiti gi na obodo ahu: che iru-gi megide ya, o we di nọchibidoro ya, ma i ga-anọchibido ya. Nke a ga-abụ ihe ịrịba ama ulo Israel. 4:4 Gi onwe-gi kwa dina n'akuku aka-ekpe-gi, tukwasi kwa ajọ omume nke ulo nke Israel n'elu ya: dika ọnu-ọgugu ubọchi nile si di nke i gēdina ala n'elu ya ka i gēbu ajọ omume-ha. 4:5 N'ihi na Mu onwem tukwasiworo gi arọ nke ajọ omume-ha, dika Jehova si di ọnu-ọgugu ubọchi, nnù ubọchi na ọgu iri-na-iteghete: otú a ka i gēbu ajọ omume nke ulo Israel. 4:6 Ma mgbe i mezuru ha, dina ọzọ n'akụkụ aka nri gị, na i gēbu kwa ajọ omume nke ulo Juda ọgu ubọchi abua: m'nwere họpụtara gị ụbọchị ọ bụla maka otu afọ. 4:7 N'ihi nka ka i gēche iru-gi na nnọchibido nke Jerusalem, na agēkpughe ogwe-aka-gi, i gēbu kwa amuma megide ya. 4:8 Ma, le, M'gātukwasi gi ab͕u, ma i gaghi-atụgharị gi site n'otù akuku rue ibe-ọzọ, rue mb͕e i gāgwusia ubọchi nile nke nnọchibido-gi. 4:9 I were kwa n'onwe-gi ọka wheat, na ọka barley, na agwa, na lentil, na millet na fitch, tiye ha n'otù ihe, me onwe-gi achicha nime ya, dika ọnu-ọgugu ubọchi ahu si di nke i gēdina n'elu ya akuku-gi, nnù ubọchi iri-na-iteghete ka i gēri ufọdu nime ya. 4:10 Ma ihe-oriri-gi nke i gēri, n'ọtùtù, orú shekel a Ụbọchị: site n'oge ruo n'oge ka i gēri ya. 4:11 I gāṅu kwa miri n'ọtùtù, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin: site na Mgbe ụfọdụ ka ị ga-aṅụ. 4:12 Ị ga-eri ya dị ka achịcha ọka barley, na ị ga-eji nsị mee ya nke nēsi n'aru madu puta, n'anya-ha. 4:13 Jehova we si, Ọbuná otú a ka umu Israel gēri ha achịcha ruru árú n'etiti mba nile, ebe M'gāchupu ha. 4:14 M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, emerughi nkpuru-obim: n'ihi na site na nwata rue ub͕u a, erighim ufọdu nime ihe nānwu nime ya n'onwe ya, ma ọ bụ na-adọwa; ọ dighi kwa anu-aru jọrọ njọ batara ọnụ m. 4:15 O we sim, Le, enyewom gi ǹsí-ehi ka ọ buru ǹsí madu. i gēwere kwa ya dozie nri-gi. 4:16 Ọ sim, Nwa nke madu, le, M'gāb͕aji nkpa-n'aka nke achịcha na Jerusalem: ha gēri kwa achicha n'ọtùtù na nlezi-anya; ha gāṅu kwa miri n'ọtùtù, na n'iju-anya; 4:17 Ka ha we gua achicha na miri, Ijuta kwa ibe-ha anya; Me kwa ka ebibie ha n'ihi ajọ omume-ha.