Deuterọnọmi
34:1 Moses we si n'ala ihe nādighi nke Moab rigorue ugwu Nebo, rue
elu Pisga, nke di na ncherita-iru Jeriko. Jehova we gosi ya
ala nile nke Gilead, rue Dan;
34:2 na Naftali nile, na ala Efraim, na Manase, na ndi nile.
ala Juda, rue nsọtu oké osimiri;
34:3 na Negeb, na ala nke ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwu.
osisi, rue Zoa.
34:4 Jehova we si ya, Nka bu ala ahu nke M'ṅuru Abraham iyi.
nye Aisak, nye kwa Jekob, si, M'gēnye ya nye nkpuru-gi;
mere ka i were anya-gi hu ya, ma i gaghi-agabiga
ebe ahu.
34:5 Moses, bú orù Jehova, we nwua n'ebe ahu n'ala Moab;
dika okwu Jehova si di.
34:6 O we lìe ya na ndagwurugwu nke di n'ala Moab, na ncherita-iru
Bet-peoa: ma ọ dighi onye ọ bula mara ílì-ya rue ta.
34:7 Ma Moses b͕ara ọgu arọ isi na iri mb͕e ọ nwuru: anya-ya di
ọ dịghịkwa inyoghi inyoghi, ike eke ya adịghịkwa adalata.
34:8 Umu Israel we kwara Moses ákwá n'ala ihe nādighi nke Moab orú na iri
ubọchi: ewe gwusia ubọchi ikwa-ákwá na iru-újú Moses.
34:9 Joshua nwa Nun we juputa na mọ nke amam-ihe; maka Moses
ebikwasiwo ya aka-Ya abua: umu Israel we ge nti
o we me dika Jehova nyere Moses iwu.
34:10 Ma ọ dighi onye-amuma biliri n'Israel dika Moses, onye Jehova
Jehova mara iru na iru;
34:11 N'ihe-iriba-ama nile na ọlu-ebube nile, nke Jehova zitere ya ka o me
ala Ijipt diri Fero, di-kwa-ra ndi-orù-ya nile, di-kwa-ra ala-ya nile;
34:12 na n'aka nile dị ike, na n'oké egwu nke Moses
ewe gosi ya n'anya Israel nile.