Deuterọnọmi
8:1 Ihe niile m nyere n'iwu nke m na-enye gị n'iwu taa ka ị ga-edebe
menu, ka unu we di ndu, ba uba, ba nime, nweta ala ahu nke
Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi.
8:2 I gēcheta kwa uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-gi, duworo gi
ọgu arọ abua ndia n'ọzara, iweda gi n'ala, na inwa gi;
imara ihe di n'obi-gi, ma I nēdebe nke-ya
iwu-nsọ, ma-ọbụ mba.
8:3 O we weda gi ala, nye kwa gi ka agu gua, were kwa gi rie nri
manna, nke i nāmaghi, nna-gi-hà nāmaghi kwa; na ya
we me ka i mara na ọ bughi nání achicha ka madu nēji di ndu, kama ọ bu site n'ihe ọ bula
Okwu nke nēsi n'ọnu Jehova puta ka madu gādi ndu.
8:4 Uwe-gi akaghi aka nká n'aru gi, ọ bu kwa ukwu-gi azaghi aza, ndia
afọ iri anọ.
8:5 I gāhu kwa n'obi-gi, na, dika madu si adọ ya aka na nti
nwa-nwoke, otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nādọ gi aka na nti.
8:6 N'ihi ya, i gēdebe ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, ije ije
n'uzọ-Ya nile, na itu egwu Ya.
8:7 N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nēme ka i ba n'ezi ala, ala miri-iyi nke
miri, nke isi-iyi na miri emi nēsi na ndagwurugwu na ugwu nērù;
8:8 Ala nke ọka wheat, na ọka barley, na osisi vine, na osisi fig, na pomegranate;
ala nke manu olive, na manu-aṅu;
8:9 Ala nke ị ga-eri nri n'ime ya, ị gaghị
enweghị ihe ọ bụla n'ime ya; ala nke nkume-ya bu ígwè, site kwa na ya
ugwu ka i gāgwu ọla.
8:10 Mgbe i rijuworo afọ, i ga-agọzikwa Jehova gị
Chineke maka ezi ala ahu nke O nyeworo gi.
8:11 Lezie anya ka i ghara ichezọ Jehova, bú Chineke-gi, n'ichezọ nke ya
ihe nile enyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu
ụbọchị taa:
8:12 ka i we ghara iri ihe rijue afọ, i we wue ulo ọma;
we biri nime ya;
8:13 Ma mb͕e ìgwè ehi-gi na ìgwè ewu na aturu-gi nāba uba, na ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi
nāba uba, ma ihe nile nke i nwere nāba uba;
8:14 Obi-gi we di elu, i we chezọ Jehova, bú Chineke-gi, nke
me ka i si n'ala Ijipt puta, n'ulo ndi-orù;
8:15 Onye duru gi n'ime oké na egwu, nke dị n'ime ya
agwọ nādi ọku, na akpi, na oké ọkọchị, ebe miri nādighi;
Onye mere ka miri si na nkume nkume di elu puta;
8:16 Onye were mana rie gi n'ọzara, nke nna-gi-hà nāmaghi.
ka O we weda gi n'ala, ka O we nwa gi, ime gi ezi ihe
n'ikpeazụ gị;
8:17 I we si n'obi-gi, ikem na idi-uku nke akam nwere
nwetara m akụ na ụba a.
8:18 Ma i gēcheta Jehova, bú Chineke-gi: n'ihi na Ya onwe-ya nēnye gi
ike inweta àkù, ka o we me ka ọb͕ub͕a-ndu-Ya guzosie ike nke Ọ ṅuru iyi
nye nna-gi-hà, dika ọ di ta.
8:19 Ọ gēru kwa, ọ buru na i chezọ Jehova, bú Chineke-gi, we je ije
iso chi ọzọ di iche iche, nēfè ha òfùfè, nākpọ kwa isi ala nye ha, ka M'nāb͕a àmà megide ha
unu ta na unu aghaghi ila n'iyì.
8:20 Dị ka mba ndị Jehova na-ebibi n'ihu unu, otú ahụ ka unu ga-
laa n'iyi; n'ihi na unu egeghi nti n'olu Jehova
Chineke.