2 Ndị eze 24:1 N'ubọchi-ya, Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoro, ma Jehoiakim di orù-ya arọ atọ: o we chigharia nupu isi n'okpuru ya. 24:2 Jehova we ziga usu nile nke ndi Kaldea, na usu nile nke ndi-agha imegide ya Siria, na usu nile nke ndi Moab, na usu nile nke umu Amon; o we ziga ha imegide Juda ibibi ya, dika okwu Jehova si di Jehova, bú nke O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma. 24:3 N'ezie n'okwu-ọnu Jehova ka ihe a biaruru Juda, iwepu ha si n'iru Ya puta, n'ihi nmehie Manase, dika ihe ahu nile si di o mere; 24:4 na kwa n'ihi ọbara nēmeghi ihe ọjọ nke ọ wusi: n'ihi na o mejuwo Jerusalem ya na ọbara na-emeghị ihe ọjọọ; nke Jehova nāgaghi-agbaghara. 24:5 Ma okwu Jehoiakim nile nke fọduru, na ihe nile o mere, ọ bughi ya edewo n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 24:6 Jehoiakim we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: Jehoiakin nwa-ya we buru eze nime ya ọnọdụ ya. 24:7 Ma eze Ijipt esighi n'ala-ya puta ọzọ; eze Babilon esiwo n'osimiri Ijipt buruburu rue osimiri ahu Euphrates nile nke eze Ijipt nwere. 24:8 Jehoiakin b͕ara arọ iri na asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze na Jerusalem ọnwa atọ. Ma aha nne-ya bu Nehushta; ada Elnetan nke Jerusalem. 24:9 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile nna-ya mere. 24:10 Na mb͕e ahu ndi-orù Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoro imegide Jerusalem, ewe nọchibidoro obodo ahu n'agha. 24:11 Nebukadneza, bú eze Babilon, we bia imegide obodo ahu, ya na ndi-ya ndị ohu nọchibidoro ya. ỌPUPU 24:12 Jehoiakin, bú eze Juda, we pukuru eze Babilon. na nne-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-orù-ya: na eze Babilon we kuru ya n'arọ nke-asatọ nke ọbubu-eze-ya. 24:13 O si n'ebe ahu bupu àkù nile nke ulo Jehova. na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe nile ọla-edo nke Solomon, bú eze Israel, mere n'ulo Jehova; dika Jehova kwuru. 24:14 O we me ka Jerusalem nile, na ndi-isi nile, na ndi nile ndi-dike bu dìnkpà, bú orú nnù ndikom na nnù ise adọtara n'agha, na ndi-ọ̀kà nile na ndi-uzu: ọ dighi onye fọduru, ma-ọbughi ndi-ob͕eye nke ndi Jehova ala. 24:15 O we me ka Jehoiakin je biri na Babilon, na nne eze, na ndinyom eze, na ndi-orù-ya, na ndi-dike nke ala ahu, ndi ahu o si na Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn. ỌPUPU 24:16 na ndi-dike nile, bú nnù ndikom asa na ọgu iri, na ndi-ọ̀kà na ndi-ọzì. nnù abua na ọgu iri, bú ndi nile di ike, ndi nēbu agha, ọbuná ha eze Babịlọn dọọrọ n’agha laa Babịlọn. 24:17 Eze Babilon we me Matanaia, bú nwa-nne nna-ya eze n'ọchichi-ya n'ọnọdu-ya, we b͕anwe aha-ya Zedekaia. 24:18 Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we ọ bu eze arọ iri na otù nime Jerusalem. Ma aha nne-ya bu Hamutal; ada Jeremaia nke Libna. 24:19 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile nke Jehoiakim mere. 24:20 N'ihi na ọ bụ n'ihi na ọ bụ n'ihi na iwe Jehova mere na Jerusalem na Juda, rue mb͕e Ọ siri n'iru Ya chupu ha, na Zedekaia nupuru eze Babilon.